“Anyị Bụ́ Ndị Katọlik Nwere Ihe Dị Ukwuu Ịmụta n’Aka Ha”
OTU onye nkụzi bi na Bari, Itali, kwuru nke a banyere Ndịàmà Jehova, n’oge ọ na-akụzi akụkọ ihe mere eme nke okpukpe n’ụlọ akwụkwọ dị elu. Onye nkụzi ahụ agwawo klas ahụ na ya ga na-eji kaseti vidio eme ihe dị ka ihe enyemaka n’ịkụzi ihe. Mgbe ọ nụrụ nke a, otu n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ, bụ́ Roberto nke dị afọ 18, tụrụ aro iwebata okpukpe ya ná mkparịta ụka ahụ. O nyere ya ihe nkiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Ọ nakweere ihe Roberto nyere, klas ahụ dum nke ihe dị ka ụmụ akwụkwọ 30 kirikwara vidio ahụ. “Ịdị n’otu, nhazi, nakwa ịhụnanya miri emi nke jupụtara n’etiti Ndịàmà Jehova, masịrị ha nile,” ka Roberto na-ekwu. “O juru ha anya ọbụna karị ịmata na a na-ebipụta nde 40 nke Ụlọ Nche na nde 36 nke Teta! kwa ọnwa.”
“Echebughị m na a haziri unu ahazi otú ahụ,” ka ụfọdụ ndị ha na Roberto nọ na klas kwuru mgbe ha kirisịrị vidio ahụ. Banyere Ndịàmà Jehova, onye nkụzi ahụ gwara klas ahụ, sị: “Lee otú okwukwe ha si akwali ha ịbụ nnọọ ndị dị n’otu na ndị a haziri ahazi. Anyị bụ́ ndị Katọlik nwere ihe dị ukwuu ịmụta n’aka ha.” Ihe nkiri vidio ahụ na mkparịta ụka klas nke sochirinụ rụrụ ọrụ dị ukwuu n’ịkwalite nghọta ka mma banyere Ndịàmà Jehova.