Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/15 p. 32
  • Ị̀ Ga-aṅa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-aṅa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Ahụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/15 p. 32

Ị̀ Ga-aṅa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Ahụ?

NA May 19, 1997, ajọ ifufe fekwasịrị ógbè Chittagong, Bangladesh. E dekọrọ na ifufe na-efe ihe dị ka kilomita 250 n’otu awa fere n’obodo Cox Bazaar. N’ime ime obodo, ụlọ akịrịka funyụrụ nnọọ anya, obere ọ́gbà ájá ndị dị n’ebe ha dịbu bụ ihe fọdụziri. Osisi na poolu teligraf dị iche iche fopụsịrị; ndị ọzọ si n’etiti gbajisịa dị ka mkpaọkụ. Otu isiakụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Bhorar Kagoj kọrọ na ajọ ifufe ahụ gburu mmadụ 105.

Ndị ọrụ ịkọ ihu igwe mara ọkwa banyere ụzọ o yiri ka ajọ ifufe ahụ ọ̀ ga-esi abịa n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa 36 tupu ọ malite. Obi abụọ adịghị ya na a zọpụtara ọtụtụ ndụ ka ọtụtụ narị puku mmadụ gbabara n’ụlọ ndị na-egbochi mmetụta ajọ ifufe bụ́ ndị a wụrụ awụ.

Ruo ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, Ndịàmà Jehova anọwo na-agbasa ozi mbibi nke na-eru nso bụ́ nke ga-ebibi ihe nke ukwuu karịa ajọ ifufe ọ bụla. Bible na-akpọ ya ‘ụbọchị dị ukwuu, dịkwa egwu nke Jehova.’ (Joel 2:31) Site n’ịṅa ntị n’ozi ịdọ aka ná ntị nke amụma ndị dị na Bible, anyị pụrụ ịgbanahụ oké mbibi ya.—Zefanaịa 2:2, 3.

Ee e, Ndịàmà Jehova abụghị ndị na-ebu amụma ọdachi. Ozi ha bụ ozi na-enye olileanya. Ha nwere ọchịchọ inyere ndị mmadụ aka ịmụta banyere Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-ewepụ ajọ omume nile n’ụwa n’oge na-adịghị anya. Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-agwa anyị, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma ọ gaghị anọ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

WHO/Òtù Red Cross

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya