Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 4/15 p. 32
  • Udo Ụwa—Site N’ole Ebe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Udo Ụwa—Site N’ole Ebe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 4/15 p. 32

Udo Ụwa—Site N’ole Ebe?

IME ka agụmakwụkwọ na okpukpe gbasaruo n’ụwa dum ọ̀ ga-eweta udo ụwa? Nke a bụ atụmanya Dr. Robert Muller, onye bụbu osote odeakwụkwọ ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu na onye nwetara Onyinye Maka Agụmakwụkwọ Udo nke 1989 nke UNESCO. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Vancouver Sun, Dr. Muller “kwenyesiri ike na a ghaghị ịkụziri ụmụ akwụkwọ nile nke ụwa usoro ihe ọmụmụ ndị bụ́ eziokwu banyere mbara ụwa, ụmụ mmadụ na emeghị ihe ike.” O chere n’echiche ụbọchị ụlọ akwụkwọ nile dị gburugburu ụwa ga-akụziri ụmụaka banyere òtù UN dị ka olileanya kasị mma maka udo. O kwenyekwara na “okpukpe nile nke ụwa ga-aghọ òtù ọhụrụ yiri òtù UN nke a kpọrọ Okpukpe Ndị Dị n’Otu,” ka Sun kọrọ. Mgbe ahụ “ozizi okpukpe nile ga-akwalite emeghị ihe ike.”

Udo ụwa ọ̀ ga-aghọ ihe dị adị n’ezie? Kpọmkwem! Ma ọ bụghị site n’aka òtù ọ bụla nke mmadụ. Ihe karịrị afọ 2,700 gara aga, otu nwoke bụ́ onye edemede e nyere ike mmụọ nsọ kọwara ebe dị elu e si enweta ihe ọmụmụ maka udo mgbe o buru n’amụma na ndị obi ha ziri ezi ga-abụ ndị “mmụta Jehova,” na udo ha “ga-abakwa ụba.”—Aịsaịa 54:13.

Chineke bụ onye “na-enye udo,” ka Bible na-ekwu. (Ndị Rom 16:20, NW ) Ọbụna ugbu a, ọmụmụ ihe magburu onwe ya nke zuru ụwa ọnụ na-aga n’ihu ka Jehova na-enye ndị ya ntụziaka ka ha “chọọ udo, gbasookwa ya,” ‘kpụgharịa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè,’ gharakwa ‘ịmụta agha ọzọ.’—1 Pita 3:11; Aịsaịa 2:2-4.

Ofufe nke hiwere isi n’eziokwu, nke ihu abụọ na aghụghọ na-adịghị na ya, ka Chineke na-anabata ma na-agọzi. (Matiu 15:7-9; Jọn 4:23, 24) Nanị ezi ofufe, nke kwekọrọ n’ụzọ zuru ezu n’Okwu Chineke, pụrụ ime ka e nwee ndị mmadụ na-ebi n’udo ma dịrị n’otu, nweekwa ezi ịhụnanya maka ibe ha.—Jọn 13:35.

Iji mụtakwuo banyere ihe Okwu Chineke na-ekwu banyere udo ụwa, anyị na-akpọ gị òkù ịkpọtụrụ ndị na-ebipụta magazin a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya