Ịhụnanya Maka Ndị “Ezinụlọ nke Okwukwe”
EZI ndị Kraịst nwere nkekọ yiri nke ezinụlọ n’etiti onwe ha. N’ezie, kemgbe narị afọ mbụ O.A., ha akpọwo ibe ha ‘nwanna nwoke’ na ‘nwanna nwanyị.’ (Mak 3:31-35; Faịlimọn 1, 2) Ha abụghị okwu efu; ha na-akọwa otú ndị na-efe Chineke si ele ibe ha anya. (Tụlee 1 Jọn 4:7, 8.) Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:35.
Ịhụnanya dị otú ahụ pụtara ìhè na July 1997 mgbe oké mmiri ozuzo na idei mmiri sochiri ụkọ mmiri ozuzo were ogologo oge na Chile. Na mberede, ọtụtụ ndị bara ná mkpa ihe oriri, ákwà, na ihe ndị ọzọ. N’oge ọdachi, Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike ịgbaso ndụmọdụ Pọl nyere ndị Galetia: “Ya mere otú a, otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.”—Ndị Galetia 6:10.
N’ihi ya, Ndịàmà Jehova haziri onwe ha ozugbo ime ihe. A tụkọtara ihe oriri, ákwà, na ihe ndị yiri ha, họchasịa ha, kwakọta ha, ma jiri ụgbọ mmiri bugazie ha n’ógbè ahụ ọdachi mere. Ọbụna ụmụaka nyere ihe ụmụaka ji egwu egwu! O juru otu nwanna nwanyị anya mgbe ọ hụrụ ka ihe enyemaka juru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. “Eguzoro m n’enweghị ọnụ okwu, n’amaghị ka ọ̀ bụ m chịwa ọchị ka ọ bụ m bewe ákwá,” ka ọ na-ekwu. “Ọ bụ nnọọ ihe dị anyị mkpa.”
Mgbe ahụ, na mberede, ala ọma jijiji tiwapụrụ n’otu akụkụ nke ógbè ahụ idei mmiri kpara aka ọjọọ. O mebisịrị ọtụtụ ụlọ. Iji hụ na e gboro mkpa ahụ, e guzobekwuru kọmitii enyemaka. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè, bụ́ ndị na-ewu ụlọ nzukọ nke Ndịàmà Jehova, batara ma nye nkwado ha. Gịnị si na ya pụta? E nyere ndị ahụ ebe obibi ha funahụrụ ụlọ ndị dị mma—ndị ụmụnna tụpụtara ụkpụrụ ha ma wuo—n’onyinye. Ọ bụ ezie na ụlọ ndị a dị obere, ha pụrụ nnọọ iche n’ebe ndị nke ndị ọrụ enyemaka obodo gbazinyere ndị mmadụ ka ha na-akwụ ụgwọ dị, bụ́ ndị a na-eteghị ala ha simenti, ndị na-enweghị windo, ndị a na-eteghịkwa ágbá.
Ụmụnna ụfọdụ mere ogologo njem iji nye aka. Onyeisi oche nke otu Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè mere njem sara mbara n’ụbọchị abụọ sochiri ibe ha—n’agbanyeghị na o ji oche nkwagharị aga. Otu nwanna nwoke kpuru ìsì rụsiri ọrụ ike, na-eburu osisi ebugara onye kapịnta bụ́ onye kwọbiri ha otú a chọrọ ka ha hara. Otu nwanna nwoke ntị chiri buruziiri osisi ndị ahụ gaa n’ebe a chọrọ ha.
Enyemaka sitere n’aka ụmụnna ahụ masịrị ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ. N’otu obodo, ndị uwe ojii kwụsịrị ụgbọala ha na nso ụlọ otu nwanna nwanyị bụ́ nke a na-arụzi arụzi. Ndị uwe ojii ahụ chọrọ ịmata ihe na-emenụ. Otu jụrụ otu nwanna nwoke, sị: “Olee ndị bụ́ ndị ọrụ a ndị yiri ka ha nwere nnọọ obi ụtọ, ego olekwa ka a na-akwụ ha?” Nwanna ahụ kọwara na ha nile bụ ndị ọrụ afọ ofufo. Otu n’ime ndị uwe ojii ahụ kọwara na ya na-akwụ chọọchị ya otu ụzọ n’ụzọ iri kwa ọnwa, ma onye pastọ ha abịabeghịdị leta ya kemgbe ala ọma jijiji ahụ mere! N’echi ya, otu onye uwe ojii kpọrọ nwanna nwanyị ahụ na fon. Ya onwe ya ekiriwokwa ndị ọrụ ahụ. Ọ sịrị na mmụọ ịnụ ọkụ n’obi nke ndị ọrụ ahụ masịrị ya nke ukwuu nke na ọ fọrọ nke nta ka ya sonyere ha!
N’eziokwu, ọrụ enyemaka ahụ a rụrụ na Chile bụụrụ ndị ọrụ afọ ofufo ahụ ahụmahụ na-enye ọṅụ, ọ gbakwaara ndị kiriri ihe merenụ àmà magburu onwe ya.