Ihe Dị Mma Karịa Ihe Ntecha
MGBE Pita onyeozi zosịrị aka ‘n’ihe enyemaka elu ahụ’ nke ndị inyom ji mee ihe dị ka ihe ndị na-eme ka mmadụ makwuo mma, ọ dụrụ ọdụ, sị: “Kama nke ahụ, mma unu kwesịrị ịgụnye mmadụ ime unu n’ezie, bụ́ ịma mma na-adịghị aka nkà nke mmụọ dị nwayọọ, dịkwa jụụ, bụ́ nke kasị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.”—1 Pita 3:3, 4, Today’s English Version.
N’ụzọ na-akpali mmasị, mgbe onyeozi ahụ dere banyere ihe ịchọ mma elu ahụ dị otú ahụ, o ji otu ụdị nke okwu Grik bụ́ koʹsmos mee ihe, nke bụkwa ebe e si nweta okwu Bekee bụ́ “cosmetic” (ihe ntecha), bụ́ nke pụtara “ihe e mere maka mma karịsịa nke ụcha akpụkpọ ahụ.” Pita ọ̀ na-amachibido ndị inyom bụ́ ndị Kraịst iwu n’ihe metụtara ite ihe otite na ihe ndị ọzọ e ji achọ mma? Ọ dịghị ihe dị n’Okwu Chineke nke na-enye echiche ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-enye ohere maka mkpebi onwe onye n’okwu a, ya mere a pụrụ ịtụ anya ndịrịta iche ụfọdụ ná nhọrọ ndị mmadụ n’otu n’otu.
Otú ọ dị, ọ bụrụ na e tebiga ihe otite ókè, ma ọ bụ teruo ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enye ọtụtụ ndị ọzọ nsogbu, echiche dị aṅaa ka a na-enye? Ọ́ bụghị nke imebiga ihe ókè, aghara, mweda n’ala, ime oké ngosi, ma ọ bụ nke mmadụ iche nanị banyere onwe ya? N’ezie, ọ pụrụ ime ka ọdịdị nwanyị gharakwa ịdịcha ùgwù, ikekwe na-enye echiche na-ezighị ezi banyere omume ya.—Tụlee Ezikiel 23:36-42.
N’ịmata nke a, nwanyị nke “na-ekwupụta egwu Chineke” ga-agbalị, ma ọ bụrụ na ọ chọọ ite ihe ntecha, ime ka ihu ya gosipụta njimara nke anya udo, ịdị nwayọọ, obiọma, na obi umeala. Àgwà ndị dị otú ahụ ga-eme ka o nwekwuo ùgwù ma makwuo mma. N’ezie, ma ọ̀ họọrọ ite ihe otite ma ọ bụ na ọ họrọghị, ọ ga-egosipụta ịdị ùgwù na ịma mma nke dị n’ime. Nke a ga-egosipụta na ọ maara na, dị ka okwu Pita e hotara n’elu na-egosi, e nwere ihe dị mma karịa ihe ntecha.—1 Timoti 2:9, 10.