Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 8/1 p. 32
  • Ịkpa Ókè Agbụrụ na Okpukpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkpa Ókè Agbụrụ na Okpukpe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 8/1 p. 32

Ịkpa Ókè Agbụrụ na Okpukpe

“MGBE m bịara na United States na 1978, m kweere na America edoziwo nsogbu ịkpa ókè agbụrụ ya kemgbe, na ndị isi ojii bụ ụmụ amaala ha na ndị ọzọ ha nhata,” ka Mark Mathabane, bụ́ onye edemede a mụrụ na South Africa kwuru, n’oge magazin bụ́ Time na-agba ya ajụjụ ọnụ. “N’ọtụtụ ụzọ, achọpụtara m na nke ahụ bụ eziokwu. O yiri ka United States ọ̀ karịrị nnọọ South Africa. Mgbe ahụ, achọpụtara m, n’ụzọ wụrụ m akpata oyi, na e nwebeghị mgbanwe dị ukwuu n’obi ụmụ mmadụ.” Gịnị dugara ya ná nchọpụta ahụ na-eju anya?

“Otu n’ime awa ndị nkewa kasị apụta ìhè na ha n’America bụ elekere 11 n’ụtụtụ Sunday,” ka Mathabane kwuru. O kwuru na ọbụna n’ime chọọchị, ndị mmadụ adịghị enwe ọchịchọ iso ndị si n’agbụrụ ọzọ fee ofufe. “Olee mmetụta ha pụrụ inwe n’ụbọchị ndị ọzọ nke izu?” ka ọ jụrụ. N’ịkpọ òkù maka mmụta dị ka ihe ga-eweta mgbanwe, Mathabane kwuru, sị: “Site ná mmụta, a na-eme ka ị nabata ịha nhata nke ụmụ mmadụ.”

Ndịàmà Jehova kwenyere na mmụta bụ ihe ngwọta ya, ma ha na-atụ aro karịsịa banyere mmụta dabeere n’Okwu Chineke. Ee, Bible na-enyere ha aka itida ihe mgbochi nile nke ajọ mbunobi agbụrụ na-eweta—ọbụna n’ala ebe ịkpọasị agbụrụ jupụtara. Kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, ndị sitere n’agbụrụ na mba dị iche iche na-abịakọta ọnụ iji bụrụ ndị e ziri ihe n’iwu na ụkpụrụ dị iche iche nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. A dịghị anakọta ụtụ ọ bụla ná nzukọ ndị a. A na-agba gị ume ịbịa!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya