“Nleta M Letara Ụlọ Nzukọ Alaeze”
E kenyere Laura,a bụ́ nwa akwụkwọ kọleji, ije otu ihe omume okpukpe ma dee akụkọ banyere ihe ndị ọ hụrụ. Ọ họọrọ Ndịàmà Jehova, o nyekwara edemede ya isiokwu bụ́ “Nleta M Letara Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Gịnị bụ ihe dị iche Laura hụrụ banyere Ndịàmà? N’ime ọtụtụ ihe ndị ọ kpọtụrụ aha bụ ndị a.
Ụmụaka: “Ụmụaka nile so ndị toro eto nọrọ n’otu ọnụ ụlọ. Na chọọchị nile ndị m gaworo, ụmụaka na-ahapụ ndị mụrụ ha, ha aghaghịkwa ịga Sunday School.”
Ịdị n’otu agbụrụ: “Dị ka ọ na-adịkarị, chọọchị dị iche iche na-anabata ndị òtù nke otu agbụrụ. . . . Ma, Ndịàmà Jehova nile nọkọrọ ọnụ, ọ bụghịkwa n’òtù dị iche iche.”
Mmụọ ịnabata mmadụ: “Ọtụtụ ndị bịakwutere m ma gwa m okwu. . . . Ọbụna ụfọdụ ndị jụrụ m ma ọ̀ dị onye mụ na ya na-amụ Bible. Ma, echeghị m na ha na-arụgide m. Ha . . . hapụrụ m ka m mee mkpebi ahụ.”
A nakọtaghị ụtụ: “Otu ihe nke juru m anya n’ezie bụ eziokwu bụ́ na ọ dịghị onye nakọtara ụtụ. . . . Chọọchị ndị m gaworo na-anakọta ụtụ ọbụna na klas ụmụaka.”
E nwere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgbakọ 90,000 nke Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Gịnị ma i leta otu dịkarịsịrị gị nso?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Aha ndochianya.