Ọ Gbanyeghachiri Mgbaaka Ndị ahụ na Mkpịsị Aka Ha
“LEE anya na mkpịsị aka m. Ò nwere ihe dị iche ị hụrụ?” Otu nwoke gbatịpụụrụ otu nwanyị, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova aka ya, bụ́ onye lere ya anya ma chọpụta ozugbo na nwoke ahụ agbaghịzi mgbaaka agbamakwụkwọ ya. Ọ kọwara na ya na nwunye ya adịghịzi ná mma, ya mere ha kpebiri ịgba alụkwaghịm. “Mbanụ!” ka Onyeàmà ahụ kwuru. “Were akwụkwọ a gụọ. Ọ ga-enyere unu aka n’alụmdi na nwunye unu.” Mgbe o kwusịrị nke ahụ, o nyere ya akwụkwọ ahụ dabeere na Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.a
Ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, nwoke ahụ ji ihu ọchị lọghachikwute Onyeàmà ahụ. O gosiri ya aka ya. Ugbu a, ọ gba mgbaaka agbamakwụkwọ ya. Ọ gwara Onyeàmà ahụ na ya na nwunye ya agụwo akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ nakwa na ha nwere nnọọ obi ụtọ ugbu a. N’ụzọ nkịtị, akwụkwọ ahụ agbanyeghachila mgbaaka ndị ahụ na mkpịsị aka ha.
Ndụmọdụ Bible pụrụ inyere di na nwunye aka igosirịta ibe ha ezi ịhụnanya. Nke a dị otú a n’ihi na onye chepụtara Bible abụghị onye ọzọ karịa Onye Okike anyị, bụ́ onye na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.”—Aịsaịa 48:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.