Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 3/15 p. 32
  • Ihe Na-agụ Ya Agụụ Ma O Cheta New York City

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Na-agụ Ya Agụụ Ma O Cheta New York City
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 3/15 p. 32

Ihe Na-agụ Ya Agụụ Ma O Cheta New York City

E GOSIPỤTAWO ihe ịrịba ama ahụ dị n’ebe a n’ụzọ pụtara ìhè n’elu otu n’ime ụlọ obibi akwụkwọ Watchtower Society dị na Brooklyn, New York, kemgbe afọ ndị 1950. A na-echetara ndị njem, ndị na-eme nleta, na ndị ọzọ na-agafe n’ebe ahụ ịgụ Bible kwa ụbọchị. Akwụkwọ ozi na-esonụ, bụ́ nke sitere n’aka otu nwata nwanyị bụ́ Onyeàmà, na-egosi ịdị irè nke ihe ncheta a.

“Eso m nwa klas m na-ekwurịta ihe m chọrọ ime mgbe m gụsịrị kọleji. Amalitere m ikwu banyere Betel, isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova, o wee nwee nnọọ mmasị. Ọ gwara m na ya ebiwo na New York City ná ndụ ya nile. Ezinụlọ ya ejichaghị okpukpe kpọrọ ihe, ma kwa ụtụtụ, mgbe ọ bụla o lepụrụ anya na windo, ọ na-ahụ ihe ịrịba ama nke e dere ‘Na-agụ Okwu Chineke Bụ́ Bible Nsọ Kwa Ụbọchị,’ n’elu ya. Ya mere, kwa ụbọchị, ọ na-agụ Bible ya tupu ọ gaa ụlọ akwụkwọ.

“Mgbe ha kwapụsịrị n’obodo ahụ, ọ sịrị na ihe na-agụ ya agụụ ma o cheta New York City bụ ihe ahụ na-echetara ya ịgụ Bible mgbe ọ bụla o tetara ụra, bụ́ nke ọ na-adịghịzi ahụ. Ma n’ihi ihe ịrịba ama ahụ dị n’elu ụlọ Watchtower, ịgụ Bible aghọwo àgwà ya, ya mere ọ nọgidere na-agụ Bible kwa ụbọchị!”

Olee ụzọ pụrụ ịka mma isi malite ụbọchị karịa ịgụ akụkụ nke Okwu Chineke! N’ime otú ahụ, obi abụọ adịghị ya na ị ga-aghọta okwu Pọl onyeozi, bụ́: “Ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ . . . pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta site n’okwukwe nke i kwere na Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 3:15-17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya