Ememe Pụrụ Iche—Ị̀ Ga-abịa?
N’OTU ụbọchị kwesịrị ncheta n’ihe karịrị afọ 3,500 gara aga, Jehova Chineke mere ka ezinụlọ ọ bụla nke ndị Israel nọ n’ohu n’Ijipt gbuo nwa atụrụ ma ọ bụ ewu ma fesa ọbara ya n’awara ụzọ na n’elu ọnụ ụzọ nke ụlọ ha nile. Kpọmkwem n’abalị ahụ, mmụọ ozi Chineke gabigara ụlọ nile a kara akara n’ụzọ dị otú a ma gbuo ụmụ ndị ikom nile e buru ụzọ mụọ n’ụlọ ndị Ijipt nile. E mesịa, ọ tọhapụrụ ndị Israel. N’ụbọchị ihe omume ahụ gbara afọ, ndị Juu na-eme Ememe Ngabiga.
Ozugbo Jisọs Kraịst mesịrị Ememe Ngabiga ya nke ikpeazụ ya na ndị ozi ya, o guzobere oriri nke a ga-eji na-echeta ọnwụ ịchụàjà ya. O nyefere ndị ozi ya achịcha na-ekoghị eko ma sị: “Naranụ, rie; nke a bụ ahụ m.” E mesịa, o nyere ha iko mmanya ma sị: “Unu nile ṅụọ n’ime ya; n’ihi na nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsịrị ọtụtụ mmadụ ka e wee gbaghara mmehie.” Jisọs kwukwara, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Matiu 26:26-28; Luk 22:19, 20) Ya mere, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme ememe ncheta nke ọnwụ ya.
N’afọ a, ememe mgbaafọ nke ọnwụ Jisọs dabara na Wednesday, April 19, mgbe anyanwụ dasịrị. Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-ezukọ n’anyasị a pụrụ iche iji mee Ememe Ncheta a n’ụzọ Jisọs si kwuo. Anyị ji nnọọ obi ụtọ na-akpọ gị òkù isoro anyị mee ya. Biko jụta Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị kpọmkwem oge na ebe a ga-enwe nzukọ ahụ.