Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 7/15 p. 32
  • Ọrụ Ọma Ewetara Chineke Otuto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrụ Ọma Ewetara Chineke Otuto
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 7/15 p. 32

Ọrụ Ọma Ewetara Chineke Otuto

NDỊ hụrụ Chineke n’anya na-agbalịsi ike igosipụta ìhè ime mmụọ sitere n’Okwu ya, bụ́ Bible. N’ụzọ dị otú a, ha na-agbaso iwu Jisọs, bụ́: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:16) Okwu e kwuru n’ọnụ nakwa àgwà ziri ezi pụrụ iwetara Chineke otuto.

Ndịàmà Jehova na-agbalị ime Chineke obi ụtọ site n’ime ihe n’ụzọ kwekọrọ na Bible nakwa site n’ịgbalị inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ. Ha na-eme otú ahụ ọbụna n’ala ndị a na-edebabeghị ọrụ ihu ọha ha n’akwụkwọ n’ụzọ iwu. N’isi obodo nke otu n’ime mba ndị a, Ndịàmà anọwo na-enwe mgbakọ kwa afọ bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ nke ndị na-aga ha na-adị site na mmadụ 6,000 ruo 9,000. N’ihi mgbakọ ndị dị otú ahụ, ha na-aṅụta ụlọ nzukọ ndị dị n’ebe a na-eme ihe ngosi. Dị ka ha mere n’afọ ndị bu ụzọ, tupu ha enwee mgbakọ ha na 1999, ọtụtụ narị Ndịàmà rụsiri ọrụ ike ime ka ụlọ nzukọ ndị ahụ dị ọcha na itinye ígwè okwu na ọtụtụ puku oche.

A rịbara nkwadebe nile a ama. Ndị ọrụ nlekọta nke ihe owuwu ahụ kiriri ọrụ ndị ahụ. Ha hụkwara na, n’agbanyeghị na e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 15,666 bịaranụ, ihe nile gara nke ọma, Ndịàmà ahụ mekwara nnọọ ihe n’usoro. Ndị ọrụ ahụ nwekwara mmasị ná nzacha na mkpofu e mere n’ụzọ bụ́ ịgba mgbe mgbakọ ahụ gasịrị.

Ndị nlekọta nke ebe ahụ gosipụtara ekele ha nwere maka ihe a nile site n’idebe Ndịàmà n’ọnọdụ mbụ n’ihe ndekọ ha ka ha wee nwee ike ịnọ n’ọnọdụ mbụ inweta ihe owuwu ahụ n’afọ na-esonụ. Ma ọ bụghị nanị nke ahụ ka ndị ahụ na-elekọta ebe ahụ merẹ. Na July 15, 1999, ha nyere kọmitii mgbakọ ahụ ihe nrite maka ekele ha nwere. Ihe e dere n’ihe ncheta ahụ bụ “ọgbakọ Ndịàmà Jehova”—ihe a na-atụghị anya ya ná mba ebe ọrụ nkụzi Bible ha nwere ihe mgbochi.

Gbaa ụwa gburugburu na 2000/2001, a na-atụ anya na ọtụtụ nde mmadụ ga-aga ọtụtụ narị Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” nke Ndịàmà Jehova. Site n’ịga ya, ị pụrụ ịhụ n’onwe gị otú ndị ji ịdị uchu eme ihe e kwuru n’ime Bible si ekere òkè n’ọrụ ọma ndị na-ewetara Chineke otuto.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya