Otu Ihe Mmụta Sitere n’Aka Onye Ọrụ Ụgbọ Mmiri
MMADỤ ịkwọ ụgbọ mmiri nanị ya n’etiti oké osimiri pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike. Mmetụta ọjọọ nke ike ọgwụgwụ pụrụ ime n’ụzọ dị nnọọ mfe ka ọkwọ ụgbọ mmiri nwewa mmetụta ọjọọ, nke na ọ ga-amalite mehiewa ihe ma mewa mkpebi ndị na-ezighị ezi. N’ihi nke a, ọ na-aghọta uru arịlịka bara. Ọ na-enye ọkwọ ụgbọ mmiri nke ike gwụrụ ohere izurutụ ike ma nwetaghachi ike n’enupụghị gaa ebe ọzọ n’ụzọ dị ize ndụ. N’otu oge ahụ, arịlịka na-eme ka ihu ụgbọ mmiri nọgide na-eche n’ebe ifufe na ebili mmiri si abịa ma mee ka ụgbọ mmiri ahụ nọrọ nnọọ ebe ọ nọ.
Dị nnọọ ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-eche ọtụtụ ihe ize ndụ ihu n’oké osimiri, ndị Kraịst na-eche nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị nke ụwa a ihu, ọ na-adịkwa ha mkpa izuru ike. N’ezie, Jisọs tụụrụ ndị na-eso ụzọ ya aro n’otu oge, sị: “Unu bịa iche n’ebe bụ́ ọhịa, ka unu zuru ike nke nta.” (Mak 6:31) Taa, ụfọdụ pụrụ iji izu ole na ole mee njem ma ọ bụ jiri otu ngwụsị izu mee mkpapụ iji soro ezinụlọ ha kporie ndụ. Oge ndị a pụrụ ịbụ ndị na-enye ume ọhụrụ na ndị na-enyeghachi ike. Otú ọ dị, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị nọ ná nchebe n’ụzọ ime mmụọ n’oge ndị dị otú ahụ? Gịnị pụrụ ịbụ arịlịka ime mmụọ anyị, iji nyere anyị aka iguzogide nnupụ gaa n’ebe ọzọ ma nọgide na-akwụsị ike?
Jehova enyewo anyị ihe enyemaka n’ụba. Ọ dịghị ihe ọzọ ọ bụ karịa Okwu Nsọ ya, bụ́ Bible. Site n’ịgụ ya kwa ụbọchị, anyị pụrụ ịnọ Jehova nso ma ghara isi n’ebe ọ nọ nupụ ma ọlị. Ndụmọdụ ya pụrụ ime ka anyị kwụsie ike ma nyere anyị aka iguzogide ọnwụnwa Setan na ụwa ya. Anyị ịnọgide na-enwechi usoro ọgụgụ Bible anya, ọbụna mgbe anyị na-arụ ọrụ anyị na-adịghị arụbu, pụrụ ijigide anyị n’ụzọ ime mmụọ.—Joshua 1:7, 8; Ndị Kọlọsi 2:7.
Ọbụ abụ ahụ na-echetara anyị na “onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ” nke ọ bụ “n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) Ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ga-eme ka anyị nwee ‘ihe ịga nke ọma’ na-esi n’ịbụ onye nwetara ume ọhụrụ na onye e wusiri ike n’ezie apụta, ma dị njikere ịnọgide n’ọrụ ndị Kraịst anyị.