Ịhụnanya Ndị Kraịst—Ọ Bụghị Nanị n’Ọnụ
MGBE ọkụ gbara ebe obibi ezinụlọ Bartholomew na Trinidad, ihe nile ha nwere ma e wezụga ndụ ha rechapụrụ n’ọkụ. Otu onye ikwu ha bi nso kpọbatara ha n’ụlọ ya, ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu gwụrụ.
Olive Bartholomew bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ndị òtù ọgbakọ ọ na-ejekwa ozi na ya—nakwa nke ọgbakọ ndị dị n’ógbè ndị gbara ha gburugburu—malitere inye onyinye iji wughachi ụlọ ezinụlọ ya ahụ ọkụ gbapịara. E guzobere otu kọmitii ilekọta ọrụ mwughachi ahụ, a malitekwara ọrụ ahụ. Ihe dị ka Ndịàmà 20, tinyere ụfọdụ ndị agbata obi, nọ n’ebe ọrụ ahụ. Ọbụna ndị ntorobịa sonyere, ebe ndị ọzọ bịara iji nye ha ihe ndị e ji atụrụ ndụ.
“O nyeghị ezinụlọ m ọnụ okwu,” ka Olive na-ekwu, dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Sunday Guardian nke Trinidad. “Ha abụghị Ndịàmà, ihe di m na-ahụkwa ka juru ya anya.”
Mgbe onye nlekọta ọrụ ihe owuwu ahụ na-ekwu okwu banyere mgbalị ahụ, o mesiri ya ike na omume ndị dị otú ahụ bụ n’ezie ihe ndị e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst. “Anyị adịghị aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-ekwu banyere ịhụnanya nanị n’ọnụ,” ka o kwuru. “Anyị na-agbalị ime ihe anyị na-ekwusa.”—Jọn 13:34, 35.
[Foto dị na peeji nke 32]
Olive Bartholomew na di ya