“Ihe Nlereanya nke Ịdị n’Otu”
NKE ahụ bụ isiokwu nke uche akwụkwọ akụkọ e bipụtara n’Indaiatuba, São Paulo, Brazil. Ole ndị setịpụrụ ihe nlereanya ahụ? “Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-eme atụmatụ iwu ‘Ụlọ Nzukọ Alaeze’ ọhụrụ, dị ka a na-akpọ ụlọ nsọ ma ọ bụ ụlọ mgbakọ ha, na-esetịpụ ihe nlereanya dị mma na nke gbara ọkpụrụkpụ nke imekọ ihe ọnụ bụ́ nke a na-apụghị ileghara anya,” ka onye dere ya kọwara.
Ịdị n’otu e nwere n’etiti Ndịàmà Jehova na-apụta ìhè n’oge ndị dị otú ahụ. N’ihi ya, isiokwu ahụ kwuru, sị: “Ọ bụ ihe na-akpali akpali ịhụ ndị ikom, ndị inyom, na ndị nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ndị ọrụ afọ ofufo ka ha ji ọchịchọ obi na-arụkọ ọrụ ọnụ iji wuo ebe ha pụrụ izukọ ma fee Chineke ofufe.”
Ndịàmà Jehova na-esetịpụkwa ezi ihe nlereanya n’akụkụ ndị ọzọ. “Tụkwasị n’ịmụ ihe na ikpe ekpere, nzube ha bụ ịkpụzigharị ndụ ndị aṅụrụma na ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ ma gosi ndị mmadụ ụzọ na-eduga n’ịdị n’otu na ịhụnanya,” ka uche akwụkwọ akụkọ ahụ gbakwụnyere. Olee otú ha si emezu nke a? Ndịàmà maara na ịmụta na itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ na-enyere mmadụ aka ịkwụsị omume ọjọọ. Ọ bụ ya mere ha ji agbalịsi ike ịkụziri ndị ọzọ ihe ha mụtaworo site na Bible. Uche akwụkwọ akụkọ ahụ kwubiri na nke ha bụ “ihe nlereanya nke obi abụọ na-adịghị ya na ọ dị mkpa ka a gbasoo ngwa ngwa.”
Nzukọ Ndịàmà Jehova gheere oghe nye ọha na eze, a dịghịkwa anara ụtụ maka ya. E ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ịga Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso.