Udo Ụwa—Ọ̀ Ga-esi Aṅaa Bịa?
UDO ụwa ọ̀ ga-abịa n’isi nso? Ọtụtụ ndị cheburu otú ahụ ma ha na-enwe obi abụọ ugbu a. Dị ka otu akụkọ nke na-akọ banyere ihe ndị na-ama ọdịnihu anyị aka, bụ́ nke e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ South Africa bụ́ Daily Mail & Guardian, si kwuo, “amụma ndị e buru banyere usoro ọha mmadụ na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọhụrụ bụ́ ndị e buru nanị afọ 10 gara aga yiziri inwe nchekwube olileanya na-adịghị na ya.”
Ndị dere akụkọ ahụ na-echetaghachi mmụọ nke inwe olileanya bụ́ nke jupụtara ebe nile nanị afọ iri gara aga. Agha Nzuzo ka bisiri ebi, esemokwu nke mba ndị bụ́ dike adịghịzikwa. N’ihe yiri ka ọ̀ ga-abụ mmalite nke ọgbọ ọhụrụ, ọtụtụ ndị tụrụ anya na ihe a kpọrọ mmadụ ga-amalite inwe ọganihu n’ịlụso ịda ogbenye, nrịanrịa, na okwu ndị metụtara gburugburu ebe obibi, ọgụ. “Amụma ndị ahụ yiziri atụmatụ ndị na-agaghị ekwe nnọọ omume,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “Ọgụ ndị ọhụrụ etiwapụwo n’ebe ndị anyị na-amachabughị; ịda ogbenye nọgidere na-arị elu n’ụwa. E nwere mba ọhụrụ abụọ nwere ngwá agha nuklia. Ùgwù UN nwere ebelatawo n’ụzọ dị ukwuu n’ihi na o meghị ihe kwesịrị ekwesị banyere ọtụtụ ọgba aghara ndị a na-enwe n’ihi ndị mmadụ ịchọ ịkwalite ọdịmma ha. Echiche e nwere na-esite n’atụmatụ na-agaghị ekwe omume gbanwee gaa n’ọnọdụ dị oké njọ.
Ndị na-amụ Bible maara na mgbalị mmadụ, otú ọ sọrọ ya dịruo ná mma, apụghị inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ zuru ezu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na, dị ka Bible na-ekwu, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’okpuru nchịkwa Setan, a pụghị ime ka e nwee ọnọdụ Paradaịs n’ụwa nke bụ́ ihe Chineke kere ya ịbụ.
N’otu oge ahụ, e nwere ihe ndabere maka inwe nchekwube. Jehova Chineke na-ekwe nkwa iweta udo ụwa, ọ bụghị site n’imezi usoro ihe a, kama site n’iweta “ụwa ọhụrụ” nke “ezi omume bi n’ime [ya].” (2 Pita 3:13) Ee, site n’Alaeze Chineke, a ga-agbanwe ụwa anyị ịghọ ebe obibi udo na nke obi ụtọ, bụ́ ebe ndụ na ọrụ ga na-enye ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi ọṅụ mgbe nile. Ọzọkwa, Chineke na-ekwe nkwa “[ihichapụ] anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” Nkwa ndị a adabereghị n’amụma ndị a na-ejighị n’aka nke ụmụ mmadụ. Kama nke ahụ, ha dabeere n’Okwu na-adịghị agha agha nke Onye Okike ahụ, bụ́ onye na-apụghị ikwu okwu ụgha.—Mkpughe 21:4; Taịtọs 1:2.