Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 9/15 p. 32
  • Ha Ji Aha Chineke Eme Ihe n’Ebe Etiti Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Ji Aha Chineke Eme Ihe n’Ebe Etiti Africa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 9/15 p. 32

Ha Ji Aha Chineke Eme Ihe n’Ebe Etiti Africa

IHE ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi n’Ebe Etiti Africa kweere na Chineke. Ha enweghị obi abụọ ọ bụla na ọ bụ Onye Okike nke ihe nile. (Mkpughe 4:11) Otú ọ dị, dị nnọọ ka ọtụtụ ndị nọ n’ebe ndị ọzọ, ha na-elegharakarị aha aka ya—Jehova—anya.

Ndị bi n’Ebe Etiti Africa, nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, na-ezo aka n’aha Chineke mgbe ha na-asị, “Ka e doo aha Gị nsọ” n’Ekpere Onyenwe Anyị. (Matiu 6:9) Ma ruo ogologo oge, ọ bụ mmadụ ole na ole maara aha ahụ. Otú ọ dị, ruo ọtụtụ afọ, ọrụ nkwusa Ndịàmà Jehova ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ emewo ka ndị mmadụ gbanwee àgwà ha nwere n’ebe iji aha Chineke eme ihe dị. Taa, a maara aha Chineke nke ọma ma nakwere ya n’ọtụtụ asụsụ Africa, dị ka Zulu (uJehova), Yoruba (Jehofah), Xhosa (uYehova) na Swahili (Yehova). Ma, ọtụtụ nsụgharị Bible e nwere n’asụsụ ndị a ka na-ezere iji aha Chineke eme ihe.

Otu nsụgharị mara mma nke ji aha Chineke mee ihe bụ Bible dị n’asụsụ Zande, bụ́ asụsụ a na-asụ n’akụkụ ụfọdụ nke Central African Republic, Sudan, na Democratic Republic of Congo. N’akụkụ ahụ nke ụwa, ndị mmadụ ji aha Chineke eme ihe, na-asụpe ya ịbụ Yekova n’asụsụ ala ha. N’agbanyeghị otú e si akpọ aha Chineke n’asụsụ mba, ọ dị mkpa ka e jiri ya na-eme ihe. N’ihi gịnị? N’ihi na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.”—Ndị Rom 10:13.

[Map/Foto dị na peeji nke 32]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SUDAN

CENTRAL AFRICAN REPUBLIC

DEMOCRATIC REPUBLIC OF CONGO

[Ebe E Si Nweta Foto]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya