Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 10/1 p. 32
  • Otu Ihe A Na-amụta Site ná Nkwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otu Ihe A Na-amụta Site ná Nkwụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 10/1 p. 32

Otu Ihe A Na-amụta Site ná Nkwụ

“IHE na-adọrọ adọrọ nke mara mma pụrụ iche.” Otú ahụ ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible si kọwaa ụdị nkwụ a na-akpọ date. N’oge Bible nakwa n’oge a, nkwụ date chọrọ Ndagwurugwu Naịl nke Ijipt mma, ha na-enyekwa ndo na-enye ume ọhụrụ gburugburu ala ahịhịa ndụ nke Ọzara Negeb.

Dị ka ihe ka ọtụtụ n’ụdị nkwụ ndị e nwere, nkwụ date na-akwụ nnọọ kwem n’ụzọ dị ịrịba ama. Ụfọdụ na-eto ogologo ruo mita 30 ma nọgide na-amị mkpụrụ ruo afọ 150. Ee, nkwụ date mara nnọọ mma ile anya ma na-amị mkpụrụ n’ụzọ na-atụ n’anya. Kwa afọ, ọ na-amị ọtụtụ ụyọkọ mkpụrụ. Nanị otu ụyọkọ pụrụ inwe ihe karịrị nnọọ 1,000 mkpụrụ. Otu akwụkwọ dere banyere nkwụ date, sị: “Ndị . . . tatụworo nanị mkpụrụ nkwụ date nke kpọrọ nkụ bụ́ ndị a kpọwara n’ụlọ ahịa apụghị ichetụ n’echiche otú ọ na-atọru n’ụtọ ma a taa ya mgbe ọ na-akpọbeghị nkụ.”

N’ụzọ dabara adaba, Bible ji ụfọdụ ụmụ mmadụ tụnyere nkwụ. Ka mmadụ wee bụrụ onye ihe ya na-atọ Chineke ụtọ, dị ka nkwụ na-amị mkpụrụ, ọ ghaghị inwe omume ziri ezi, ọ ghaghịkwa ịnọgide na-arụ ezi ọrụ. (Matiu 7:17-20) N’ihi nke a, e ji nkwụ e sere n’ahụ ájá chọọ ma ụlọ nsọ Solomọn ma ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ mma. (1 Ndị Eze 6:29, 32, 35; Ezikiel 40:14-16, 20, 22) N’ihi ya, ka ofufe mmadụ wee bụrụ nke Chineke na-anara, ọ ghaghị inwe àgwà ndị a na-achọsi ike dị ka nkwụ date. Okwu Chineke na-akọwa, sị: “Onye ezi omume ga-awa igu dị ka nkwụ.”—Abụ Ọma 92:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya