“Amachaghị M Chineke”
“KEMGBE afọ gara aga, Ndịàmà Jehova anọwo na-eleta m ma na-ezi m ozi dị ebube banyere Alaeze Chineke. Ekpere m Katọlik ruo afọ asatọ, ma amachaghị m Chineke. Nanị n’ime otu afọ a, amụtawo ọtụtụ ihe,” ka otu nwoke bi na Kerala, India, dere. “Obi dị m nnọọ ụtọ ịmara na a na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ 139 [146 ugbu a],” ka ọ gara n’ihu ikwu. “Ọ bụ ihe ịtụnanya na ndị na-asụ asụsụ nile na-anụ ozi banyere Chineke.”
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọkà ihe ọmụma na-ekwu na ọ gaghị ekwe omume ịmara Chineke, Pọl onyeozi mere ka o doo anya na o kwere omume. Ka Pọl na-agwa ìgwè ndị Atens okwu, ndị ụfọdụ n’ime ha nọ na-efe ofufe n’otu ebe ịchụàjà a raara nye “Chi A Na-amaghị Ama,” o kwuru, sị: “Ihe unu na-enye nsọpụrụ Chineke n’amaghị ama, nke a ka m na-ekwusara unu. Chineke nke mere ụwa na ihe nile dị n’ime ya . . . na-enye mmadụ nile ndụ na ume na ihe nile. O sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.”—Ọrụ 17:23-26.
Pọl gbara ndị na-ege ya ntị ume ịchọ ịmara Onye Okike, n’ihi na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ịmara ezi Chineke ahụ na àgwà ya ndị na-adọrọ mmasị.