Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 3/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-eme Ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Na-emenụ Nke A Ka Unu Wee Na-echeta M”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ihe Mere Anyị Ji Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Gịnị Ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị A Na-ejighị Ọtụtụ Ihe Mee Na-akụziri Anyị Banyere Eze Eluigwe?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 3/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ dị ihe a pụrụ ime ma ọ bụrụ na o kweghị Onye Kraịst e tere mmanụ nke ahụ́ na-adịkwaghị ike omume ịbịa ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị mgbe ọgbakọ na-eme ya?

Ee. Ọ dị ihe a pụrụ ma kwesị ime n’ihi ọnọdụ nke Onye Kraịst e tere mmanụ bụ́ onye ahụ́ na-adịkwaghị ike nke na-adịghị esi n’àkwà ebili ma eleghị anya, n’ihi ya kwa, ghara inwe ike ịnọ ya mgbe ọgbakọ na-eme Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. N’ọnọdụ dị otú ahụ, òtù ndị okenye pụrụ ime ndokwa ka otu okenye ma ọ bụ Onye Kraịst ọzọ tozuru okè bụ́ nwoke wegara onye ahụ kwere ekwe achịcha na mmanya ahụ bụ́ ihe nnọchianya n’otu anyasị ahụ tupu anyanwụ awaa.

Na-adabere n’otú ihe si dị, onye okenye ma ọ bụ nwanna nwoke ọzọ ahụ gara leta ya pụrụ ikwu okwu dị mkpirikpi ma gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị. Ọ pụrụ ịgbaso ụkpụrụ Jizọs tụpụtara mgbe O guzobere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịgụ Matiu 26:26 ma nye ya achịcha ahụ na-ekoghị eko mgbe e kpesịrị ekpere. Nke ahụ gasịa, nwanna nwoke ahụ letara ya pụrụ ịgụ Matiu isi 26, amaokwu 27 na 28, ma bunye ya mmanya ahụ mgbe e kpesịkwara ekpere ọzọ. Ọ pụrụ ikwu okwu dị mkpirikpi banyere ihe ihe nnọchianya nke ọ bụla pụtara, ọ ga-ekwesịkwa ekwesị ikpe ekpere mmechi.

N’ezie, e kwesịrị ime mgbalị nile ezi uche dị na ya iji nọrọ ya mgbe ọgbakọ na-eme ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ma gịnị ka a pụrụ ime n’ọnọdụ dị oké njọ nke metụtara Onye Kraịst e tere mmanụ bụ́ onye na-arịasi ọrịa ike, nke nọ n’ụlọ ọgwụ, ma ọ bụkwanụ, n’ihi ihe ọ bụla ọzọ, bụrụ onye e gbochiri iso mee Ememe Ncheta ahụ mgbe anyanwụ dasịrị na Naịsan 14? Onye dị otú ahụ e tere mmanụ pụrụ ịgbaso ụkpụrụ a gbasoro n’Iwu Mozis ma mee ememe ncheta ahụ nanị ya ụbọchị 30 mgbe e mesịrị.—Ọnụ Ọgụgụ 9:9-14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya