Nri Anyasị Ikpeazụ Ahụ—Gịnị Ka Ọ Bụ?
GỊNỊ na-abata gị n’uche mgbe ị nụrụ “nri anyasị ikpeazụ ahụ”? Ihe ga-abata ọtụtụ ndị n’uche bụ ihe osise ahụ na-adọrọ nnọọ mmasị nke dị na Milan, Ịtali, bụ́ nke Leonardo da Vinci (1452-1519) sere n’ụdị fresco. Nke bụ́ eziokwu bụ na, n’ime narị afọ ndị gara aga, Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ abụwo ihe ndị na-ese ihe na-esekarị, ihe ndị edemede na-edekarị banyere ya, na ihe ndị egwú jikarị akụ egwú.
Otú ọ dị, gịnị bụ Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ, gịnịkwa ka ọ pụtara nye ndị bi na narị afọ nke 21? Akwụkwọ nkà ihe ọmụma na nke ọkọwa okwu dị iche iche ga-agwa gị na Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ, bụ́kwa nke a na-akpọ Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, bụ nri Jizọs Kraịst so ndịozi ya rie n’anyasị ahụ bu ọnwụ ịchụàjà ya ụzọ. Ebe ọ bụ nri ikpeazụ Jizọs so ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi rie n’anyasị, a na-akpọkarị ya, Nri Anyasị Ikpeazụ ahụ. Ebe ọ bụkwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst guzobere ya n’onwe ya, aha ahụ bụ́ Nri Anyasị nke Onyenwe anyị kwesịrị ekwesị.
Eri ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ndị achụwo ndụ ha n’àjà n’ihi ihe ndị ha weere dị ka ihe kwesịrị ekwesị. Ụfọdụ n’ime ọnwụ ndị a baara ụfọdụ ndị uru ruo oge ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ọnwụ ndị a pụrụ ịbụwo ndị kwesịrị ịja mma, ha adịtụghị mkpa ma e jiri ha tụnyere ọnwụ Jizọs Kraịst. Ọzọkwa, ọ dịghị onye nwụrụ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ bụ́ nke jupụtara ná nsogbu nke ọnwụ ya pụrụ nnọọ inwe mmetụta n’ahụ́ ụwa nile otú ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?
Iji zaa ajụjụ ahụ na iji nyere gị aka ịchọpụta ihe Nri Anyasị nke Onyenwe anyị pụtara nye gị, anyị na-agba gị ume ịgụ isiokwu na-esonụ.