Vidio E Mere Otú Ọ Ga-esi Ruo Ndị Ntorobịa n’Obi
A KPALIRI ọtụtụ ndị na-eto eto inyochasi àgwà ha ike mgbe ha kiriri vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends?a Vidio a nwere ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ ịgba, okwu Ndị Kraịst na-eto eto kwuru, na ihe nkiri nke ihe na-eme n’oge a bụ́ nke na-akpali akpali nke dabeere n’ihe ndekọ Bible banyere Daịna. (Jenesis, isi 34) E si Mexico nweta ihe na-esonụ e kwuru banyere vidio ahụ.
Martha na-akọ, sị: “Vidio ahụ metụrụ m n’obi nke ukwuu. Ọ dị nnọọ ka ọ bụ m ka e bu n’uche mepụta ya. Echeburu m na ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe m marahaala na m bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o zuola. Egosipụtaghị m ya site n’ịgbara ha àmà. Ana m enwe ekele maka ihe ọmụma nile Jehova na-enye, karịsịa mgbe o metụrụ anyị n’ahụ́ nke ukwuu dị ka vidio a mere.”
Juan Carlos na-ekwu, sị: “Vidio a na-eme ka i chebara onwe gị echiche n’ezie. Dị ka nwa okorobịa, emehiewo m ihe mgbe ụfọdụ, omume m yikwara nke ụfọdụ ndị e gosiri n’ihe nkiri ahụ. Afọ ole na ole gara aga, ebiri m ụdị ndụ abụọ, ma abịara m ghọta na ụdị ndụ ahụ pụrụ ịrụpụta ajọ ihe. Mgbe m kirisịrị vidio ahụ, ekpebisiri m ike ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova.”
Sulem na-ekwupụta, sị: “Mgbe m kiriri vidio ahụ, o metụrụ m n’ahụ́ nke ukwuu. Tupu mgbe ahụ, akwụsịwo m ịgụ Bible, adịghịkwa m ekpegara Jehova ekpere mgbe nile. Mgbe m gere ntị n’ihe ndị na-eto eto a gbara ajụjụ ọnụ na vidio ahụ kwuru, a kpaliri m ịmaliteghachi ịmụ Bible na ikpegara Jehova ekpere.”
Ndị na-eto eto taa na-eche ọtụtụ ihe ịma aka ihu, mgbe mgbe kwa, ụdị ndị enyi ha na-ahọrọ pụrụ inwe mmetụta dị ike n’otú ha si ebi ndụ. (Abụ Ọma 26:4; Ilu 13:20) Vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? anọwo na-enyere ọtụtụ ndị aka ime mkpebi ndị ziri ezi n’akụkụ a.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Ndịàmà Jehova mepụtara.