“Mmadụ Abụọ Kụrụ Aka n’Ọnụ Ụzọ Anyị”
“O RUWO afọ abụọ kemgbe anyị nwere oké iru újú n’ihi ọnwụ nke obere nwa anyị nwanyị.” Otú a ka e si malite otu akwụkwọ ozi e deere ọha na eze n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Le Progrès, nke e bipụtara na Saint-Étienne, France.
“Mélissa dị ọnwa atọ ma rịa ọrịa uche bụ́ trisomy 18. Ọ na-esi ike ichefucha ọdachi dị otú ahụ nke yiri nnọọ ikpe na-ezighị ezi. Ọ bụ ezie na a zụlitere anyị n’okpukpe ndị Katọlik, anyị nọgidere na-enwe echiche bụ́ ‘Chineke, ọ bụrụ na ị dị adị, gịnị mere i ji kwere ka ihe ndị dị otú a na-eme?’” N’ụzọ doro anya, nne dere akwụkwọ ozi ahụ nwere obi erughị ala na obi nkoropụ. Akwụkwọ ozi ya gara n’ihu ikwu, sị:
“Obere oge ka nke a gasịrị, mmadụ abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. Amatara m ha ozugbo dị ka Ndịàmà Jehova. Adị m njikere iji obiọma sị ha lawa, ma achọpụtara m na ọ dị broshuọ ha chọrọ inye m. Ọ na-ekwu banyere ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. Ya mere, agwara m ha ka ha bata n’ime ụlọ n’ebumnuche nke igosi ha na ihe ha na-ekwu abụghị eziokwu. Echere m na a bịa n’ihe banyere nhụjuanya, ọ kpawo ezinụlọ m aka ọjọọ n’ezie, anyị anụwokwa okwu ndị dị ka ‘Chineke na-enye, Chineke na-ewerekwa’ ugboro ugboro. Ndịàmà ahụ nọfetụrụ otu awa. Ha ji nnọọ ọmịiko gee m ntị, mgbe ha na-apụkwa, obi dị m ụtọ nke ukwuu nke na m kwere ka ha bịa ọzọ. Nke ahụ mere afọ abụọ gara aga. Aghọbeghị m otu n’ime Ndịàmà Jehova, ma amalitewo m iso ha na-amụ Bible, m na-agakwa nzukọ ha ọtụtụ mgbe dị ka m nwere ike.”