Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 2/1 p. 32
  • Akọ na Uche Ziri Ezi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akọ na Uche Ziri Ezi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 2/1 p. 32

Akọ na Uche Ziri Ezi

OTU ụbọchị mgbe ọ na-ala ọrụ, fon cellular Charles, bụ́ onye na-arụ ọrụ n’otu mahadum dị na Kenya, funahụrụ ya. Na Kenya, ihe a ka dị oké ọnụ.

“Atụghị m anya na onye ọ bụla ga-eweghachi ya,” ka Charles kwuru. Otú ọ dị, mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ọ tụrụ ya n’anya mgbe a kpọrọ ya na fon site n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Kenya. O siiri ya ike ikweta ihe ọ na-anụ mgbe a na-agwa ya ka ọ bịa were fon cellular ya! O mesịrị bụrụ na otu onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova na Charles gbakọrọ otu ụgbọ, onye ozi ahụ hụkwara fon ahụ. Ná mgbalị ya ịchọta onye nwe ya, onye ozi ahụ wetara fon ahụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ọrụ n’ebe ahụ mechara chọta Charles site n’ịkpọ nọmba pụtara na fon ahụ.

“Enwere m ekele maka mgbalị ndị unu mere ịkpọtụrụ m n’agbanyeghị ihe isi ike ndị dị na ya,” ka Charles kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara alaka ụlọ ọrụ ahụ. “Eji m obi m nile na-ekele ndị òtù unu ahụ bụ́ ndị chọtara fon cellular ahụ, chọpụta na ọ bụ m nwe ya, ma weghachiri m ya. O siri ike ịhụ onye na-eme ihe n’eziokwu taa, ma, ọ bụ ihe na-agba ume na anyị nwere ụfọdụ ndị nọpụrụ iche dị ka ezi Ndịàmà nke Jehova Chineke.”

A maara Ndịàmà Jehova n’ebe nile n’ihi ime ihe n’eziokwu ha. Ha na-eṅomi Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Anyị tụkwasịrị obi na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18; 1 Ndị Kọrint 11:1) Ha ghọtara na àgwà dị otú ahụ na-enye Jehova Chineke otuto, dị ka Jizọs si kwuo: “Kwenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.”—Matiu 5:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya