Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 4/15 p. 3
  • À Na-eme Uche Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Na-eme Uche Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onyenwe Anyị, Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ànyị Kwesịrị Ikpegara Jizọs Ekpere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 4/15 p. 3

À Na-eme Uche Chineke?

“Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Matiu 6:10.

JULIO na Christina ji oké ụjọ kirie ka ọkụ gbagburu anọ n’ime ụmụ ha. Onye ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu suru ụgbọala ha kwụwara akwụwa, o wee nwuru ọkụ. A napụtara nwa ha nke ise, bụ́ Marcos, n’ọkụ ahụ, ma uzu ọkụ ahụ eruola ya ahụ́, na-enye ya nkwarụ na-adịghị ala ala. Ọ dị afọ itoolu. O wutere nna ya nke ukwuu. O ji okwu ndị a kasie onwe ya na ezinụlọ ya obi: “Nke a bụ uche Chineke, anyị aghaghị ịghọta nke ahụ, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, otú ọ bụla ọ dị.”

Mgbe ha na-eche ọdachi dị ka nke a ihu, ọtụtụ na-emeghachi omume n’ụzọ yiri nke a. ‘Ọ bụrụ na Chineke pụrụ ime ihe nile, na-echekwa banyere anyị,’ ka ha na-eche, ‘ihe ahụ merenụ aghaghị ịbụ maka ọdịmma anyị n’ụzọ ụfọdụ n’agbanyeghị otú ọ pụrụ ịbụru ihe siri ike nghọta.’ Ì kweere nke ahụ?

Echiche ahụ bụ́ na ihe ọ bụla merenụ, ma ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ, na-egosi ihe bụ́ uche Chineke na-adaberekarị n’okwu ndị Jizọs kwuru n’ihe a na-akpọ Ekpere Onyenwe Anyị, bụ́ nke e hotara n’elu. A na-eme uche Chineke n’eluigwe, ọ́ bụghị ya? N’ikpe, sị, ‘Ka uche gị mee n’ụwa,’ ọ̀ bụ na anyị adịghị ewere ya na ihe ọ bụla a na-eme n’ụwa bụ uche Chineke?

Ọtụtụ ejighị n’aka na echiche a ziri ezi. Nye ha, ọ na-egosi Chineke dị ka onye na-adịghị eche banyere mmetụta nke ihe o kere eke bụ́ mmadụ. ‘Olee otú Chineke na-ahụ n’anya ga-esi chọọ ka ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ?’ ka ha na-ajụ. ‘Ọ bụrụ na ọ dị ihe anyị ga-amụta na ya, gịnị ka ọ pụrụ ịbụ?’ Ikekwe, nke ahụ bụ ihe ị na-eche.

Banyere nke a, onye otu nne ji ya na Jizọs, bụ́ Jems onye na-eso ụzọ, dere, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Ọ bụghị Chineke na-akpata ihe ọjọọ. Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, ọ bụghị ihe nile na-eme n’ụwa taa bụ uche Chineke. Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa banyere ọchịchọ ma ọ bụ uche nke mmadụ, uche nke ndị mba ọzọ, na ọbụna uche nke Ekwensu. (Jọn 1:13; 2 Timoti 2:26; 1 Pita 4:3) Ì kweere na ihe mere ezinụlọ Julio na Christina apụghị ịbụwo uche Nna nke eluigwe na-ahụ n’anya?

Ya mere, gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: ‘Ka e mee uche gị’? Ọ̀ bụ nanị arịrịọ ka Chineke tinye aka n’ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem, ka Jizọs ọ̀ na-akụziri anyị ikpe ekpere banyere ihe ka ukwuu, kakwa mma, bụ́ mgbanwe nke mmadụ nile pụrụ inwe olileanya ya? Ka anyị tụlekwuo ihe Bible nwere ikwu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Ụgbọala: Dominique Faget-STF/AFP/Getty Images; nwatakịrị: Foto FAO/B. Imevbore

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya