Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 8/1 p. 32
  • “Anyị Ga-achọ Ịza, ‘Ee!’”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Anyị Ga-achọ Ịza, ‘Ee!’”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 8/1 p. 32

“Anyị Ga-achọ Ịza, ‘Ee!’”

ALAKA ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nigeria natara otu akwụkwọ ozi na nso nso a nke akụkụ ya ụfọdụ na-ekwu ihe na-esonụ:

“Nwa anyị nwoke, bụ́ Anderson, nwụrụ mgbe ọ dị afọ 14. Tupu ya anwụọ, ọ nọ na-azụ ọkụkọ abụọ. Ọ chọrọ ire ha ma zite ego o retara na ha n’alaka ụlọ ọrụ dị ka onyinye maka ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ. Ma ọ nwụrụ tupu e nwee ike ire ha.

“N’ihi ọchịchọ ya, anyị, bụ́ nne na nna ya, zụlitere ọkụkọ ndị ahụ ma ree ha. Anyị na-ezitere unu ego ahụ dị ka onyinye Anderson. N’ihi nkwa Jehova, anyị nwere obi ike na n’oge na-adịghị anya—n’oge na-adịghị nnọọ anya—anyị ga-ahụ Anderson ọzọ. Anyị ga-achọ ịza, ‘Ee!’ mgbe ọ ga-ajụ ma ànyị mezuru ọchịchọ obi ya. N’ezie, anyị na-atụ anya ịhụ ọ bụghị nanị Anderson kamakwa ‘oké ìgwè ndị àmà’ bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ.”—Ndị Hibru 12:1; Jọn 5:28, 29.

Dị ka e gosiri n’ụzọ doro anya n’akwụkwọ ozi dị n’elu, okwukwe ná mbilite n’ọnwụ bụ olileanya na-agba ezi Ndị Kraịst ume. Lee ụdị ọṅụ ọtụtụ nde ezinụlọ ga-enwe mgbe ha, dị ka ezinụlọ Anderson, ga-anabata ndị ha hụrụ n’anya bụ́ ndị onye iro ahụ bụ́ ọnwụ gburu!—1 Ndị Kọrint 15:24-26.

Okwu Chineke na-enye olileanya a na-akasi obi nke mbilite n’ọnwụ dị ka otu n’ime ọtụtụ ihe ndị dị egwu ga-eme n’isi nso n’ime ụwa ọhụrụ ezi omume n’okpuru Alaeze Chineke. (2 Pita 3:13) N’ikwu banyere ihe Chineke ga-emere ndị mmadụ n’oge ahụ, Bible na-ekwu, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.”—Mkpughe 21:4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya