Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w04 10/15 p. 32
  • Ị̀ Pụrụ Iji Anya nke Uche Hụ Ihe Ị Na-agụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Pụrụ Iji Anya nke Uche Hụ Ihe Ị Na-agụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
w04 10/15 p. 32

Ị̀ Pụrụ Iji Anya nke Uche Hụ Ihe Ị Na-agụ?

IJI jiri anya nke uche hụ ihe, ị ga-achọpụta na ọ na-enye aka ịmata ebe ndị ị na-agụ banyere ha. Dị ka ihe atụ, tụlee njem ozi ala ọzọ ndị Pọl onyeozi mere, bụ́ ndị a kọrọ banyere ha n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndịozi. Na njem ozi ala ọzọ ya nke mbụ, ọ malitere n’Antiọk, bụ́ ebe a nọ kpọọ ụmụazụ Jizọs Ndị Kraịst na nke mbụ ya. O si ebe ahụ gaa ebe ndị dị ka Salamis, Antiọk nke Pisidia, Aịkoniọm, Listra, na Dabe. Ị̀ pụrụ iji anya nke uche hụ ebe obodo ndị a dị?

Ikekwe ị pụghị, ọ gwụla ma ì ji map. E tinyere map dị otú ahụ na broshuọ ọhụrụ ahụ nwere peeji 36 bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ.’ Otu onye na-agụ akwụkwọ anyị na Montana, U.S.A., ji obi ekele na-ekwu, sị: “Apụrụ m ịhụ njem Pọl ma gbalịa iche banyere usoro o ji mee njem na ọrụ ya na ndị oge mbụ ndị ọzọ rụrụ n’ịgbasa ozi ọma ahụ. Unu emeela maka ihe a mara mma nke na-enyere mmadụ aka iji anya nke uche ahụ ihe.”

Map nke njem ndị Pọl mere bụ nanị otu n’ime ọtụtụ map ndị dị na broshuọ a bụ́ ndị ga-enyere onye na-agụ ya aka iji anya nke uche hụ ihe ndị a kọrọ banyere ha n’ime Bible. Ị pụrụ ịrịọ ka e nye gị otu ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ site n’ịkpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 2 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya