Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 2/1 p. 32
  • “Na-echenụ Nche”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-echenụ Nche”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 2/1 p. 32

“Na-echenụ Nche”

N’OGE ochie, ndị nche ọnụ ụzọ na-anọ n’ọnụ ụzọ obodo na nke ụlọ nsọ, mgbe ụfọdụkwa, n’ọnụ ụzọ ụlọ ndị mmadụ. E wezụga ịhụ na e mechiri ọnụ ụzọ ámá n’abalị, ndị nche ọnụ ụzọ na-arụkwa ọrụ dị ka ndị nche. Nke a bụ nnukwu ibu ọrụ n’ihi na, ka obodo ahụ wee nọrọ ná nchebe, ha ga-adọrịrị ndị mmadụ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ọ bụla na-abịanụ.

Jizọs Kraịst maara ọrụ ndị nche ọnụ ụzọ nke ọma. N’otu oge, o ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere ndị nche ọnụ ụzọ ma gbaa ha ume ịdị na-eche nche banyere ngwụsị nke usoro ihe ndị Juu. O kwuru, sị: “Nọgidenụ na-ele anya, nọgidenụ na-amụ anya, n’ihi na unu amaghị mgbe oge ahụ a kara aka bụ. Ọ dị ka nwoke na-eje mba ọzọ nke hapụrụ ụlọ ya wee . . . nye onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọgide na-eche nche. Ya mere nọgidenụ na-eche nche, n’ihi na unu amaghị mgbe nna nwe ụlọ na-abịa.”—Mak 13:33-35.

N’otu aka ahụ, ruo ihe karịrị otu narị na iri afọ abụọ na ise ugbu a, magazin a bụ́ Ụlọ Nche, anọwo na-enye ndị mmadụ agbamume Jizọs nke ‘iche nche.’ N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka peeji nke 2 nke magazin a si kwuo, “Ọ na-eche nche banyere ihe na-eme n’ụwa ka ihe ndị a na-emezu amụma Bible. O ji ozi ọma akasi mmadụ nile obi, na mgbe na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ndị na-emegbu mmadụ ibe ha, na ọ ga-agbanwe ụwa ịghọ paradaịs.” N’ịbụ nke a na-ekesa ihe karịrị nde iri abụọ na isii n’otu narị asụsụ na iri ise, Ụlọ Nche bụ magazin okpukpe a kasị ekesa n’ụwa nile. Dị ka ndị nche ọnụ ụzọ nke oge ochie, Ndịàmà Jehova na-eji ya agba ndị mmadụ ume n’ebe nile ka ha ‘mụrụ anya’ n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-alaghachi n’oge na-adịghị anya ma mezuo ihe e kpere n’ikpe n’isi usoro ihe a.—Mak 13:26, 37.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya