Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 5/15 p. 32
  • Na Ntọala Dị Aṅaa Ka Ị Na-ewukwasị Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na Ntọala Dị Aṅaa Ka Ị Na-ewukwasị Ihe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 5/15 p. 32

Na Ntọala Dị Aṅaa Ka Ị Na-ewukwasị Ihe?

AFỌ ole ụlọ ga-anọru dabeere n’ụzọ bụ́ isi n’otú ntọala ya siruru n’ike. Mgbe ụfọdụ, Bible na-eji ụkpụrụ a eme ihe n’ụzọ ihe atụ.

Dị ka ihe atụ, Aịzaịa onye amụma na-ezo aka n’ebe Jehova Chineke nọ dị ka onye ‘tọrọ ntọala ụwa.’ (Aịsaịa 51:13) Ihe e ji tọọ ntọala a bụ iwu Chineke ndị a na-apụghị ịgbanwe agbanwe bụ́ ndị na-achịkwa mgbagharị nke ụwa ma na-ejigide ya n’ọnọdụ ya. (Abụ Ọma 104:5) Okwu Chineke, bụ́ Bible, kwukwara banyere “ide” nke e wukwasịrị ọha mmadụ na ya. Ha bụ ikpe ziri ezi, iwu na ịdị n’usoro. Mgbe e ji ikpe na-ezighị ezi, nrụrụ aka na ime ihe ike ‘kwada’ ha ma ọ bụ mee ka ha gharazie isi ike, ọha mmadụ anaghịzi adị n’usoro.—Abụ Ọma 11:2-6; Ilu 29:4.

Ụkpụrụ a metụtakwara ndị mmadụ n’otu n’otu. N’imechi Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, bụ́ onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume. Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume. Ọzọkwa, onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma ghara ịdị na-eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nzuzu, bụ́ onye wuru ụlọ ya n’elu ájá. Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, o wee daa, ndakpọ ya dịkwa ukwuu.”—Matiu 7:24-27.

Na ntọala dị aṅaa ka ị na-ewukwasị ndụ gị? Ọ̀ bụ n’ájá na-esighị ike nke nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke, bụ́ nke ihe ga-esi na ya apụta bụ ihe owuwu ahụ ịdakasị? Ka ị̀ na-ewukwasị ya n’elu oké nkume siri ike nke nrubeisi nye okwu Jizọs Kraịst, bụ́ nke ga-enyere gị aka ịlanahụ oké ifufe ihe atụ ná ndụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya