Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 11/1 p. 32
  • Ha Na-ekwusara Ndị Ogbi Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Na-ekwusara Ndị Ogbi Ozi Ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 11/1 p. 32

Ha Na-ekwusara Ndị Ogbi Ozi Ọma

“HA NA-AKỤZIRI gị ihe ime mmụọ!” Nke ahụ bụ otú onyeisi nke ebe a na-elekọta ndị agadi nke dị n’obodo Navalcarnero, Madrid, Spen, si kọwaa na nso nso a ọbịbịa Ndịàmà Jehova na-abịa n’ebe ahụ. Gịnị kpaliri ya ikwu nke ahụ?

Ụfọdụ ndị bi n’ebe ahụ nke a na-akpọ Rosas del Camino dara ogbi. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na Ndịàmà agbalịwo ịmụta Ụdị Asụsụ Ogbi nke Spen, ha na-enwe ike ịgwa ndị a bi n’ebe ahụ okwu. Onyeisi ahụ toro Ndịàmà maka ịdị na-ewepụta oge ha iji kụziere ndị nọ ná mkpa ihe ndị sitere na Bible. O kwuru mmetụta dị mma ozi ọma Alaeze ahụ a na-akụziri ndị ahụ nwerela n’ahụ́ ha. Ndị bikwanụ ebe ahụ—karịsịa ndị nwere nsogbu ịnụ ihe ma ọ bụ ịhụ ụzọ—jikwa nnọọ nleta Ndịàmà na-eleta ebe ahụ kpọrọ ihe.

Eulogio, bụ́ onye bi ebe ahụ nke kpuru ìsì ma daa ogbi, so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ugbu a. Otu ụbọchị ka ọmụmụ ihe ahụ nọ na-aga n’ihu, otu agadi nwoke bịara nye Onyeàmà na-eduzi ya uri nke ndị bi ebe ahụ dere iji gosi ekele ha. Isiokwu uri ahụ bụ “Ịbụ Onyeàmà.” Akụkụ ya ụfọdụ kwuru, sị: “Ha na-ebi ndụ obi ụtọ na nke e ji ụkpụrụ achịkwa, Jehova na-enyekwa ha amamihe na-enye ha ọṅụ. Ha na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ugboro ugboro n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi.”

Ọ bụ kpọmkwem obi a ha tụkwasịrị Jehova mere ọtụtụ Ndịàmà gburugburu ụwa jiworo mụọ asụsụ ndị ogbi nọ ná mba ha. N’ụzọ dị otú a, ha na-ezi ndị mmadụ ozi na-agba ume na nke na-enye olileanya a na-achọta na Bible.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya