Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 3/1 p. 32
  • Ị̀ Chọrọ Inweta Ezigbo Ndị Enyi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Chọrọ Inweta Ezigbo Ndị Enyi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 3/1 p. 32

Ị̀ Chọrọ Inweta Ezigbo Ndị Enyi?

IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chọrọ inweta ezigbo ndị enyi. Ị kọrọ ndị enyi gị ahụmahụ ndị i nwere pụrụ ime ka i nwekwuo obi ụtọ. Ma olee otú ị pụrụ isi nweta ezigbo ndị enyi? Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Jizọs gosiri na isi ihe kasị eme ka mmadụ na ibe ya dịrị n’ezigbo mma bụ igosipụta ezi ịhụnanya sitere n’obi. Ọ kụziri, sị: “Dị nnọọ ka unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emeso ha n’otu ụzọ ahụ.” (Luk 6:31) Okwu a, bụ́ nke a na-akpọkarị Ụkpụrụ Ọma, gosiri na iji nweta ndị enyi, i kwesịrị ịbụ onye na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị na onye na-emesapụ aka. N’ikwu ya ná nkenke, ị ghaghị ịbụ enyi iji nweta enyi. N’ụzọ dị aṅaa?

A pụghị inweta ezigbo ndị enyi ná mberede. A sị kwuwe, ndị enyi dị nnọọ iche ná ndị mmadụ maara. Ha bụ ndị ị na-akọrọ otú ihe dị gị. Ọ na-achọ mgbalị iji mete ndị enyi nakwa iji mee ka gị na ha nọgide bụrụ ezigbo ndị enyi. Iji mee ka gị na mmadụ nọgide na-abụ enyi, i kwesịrị ibute mkpa ya ụzọ. Ọ bụghị nanị na ndị enyi na-aṅụrịkọ ọṅụ mgbe ihe dịịrị ibe ha mma, ha na-esokwa ibe ha enwe mwute mgbe ihe siiri ha ike.

Ị na-egosipụta na ị bụ ezigbo enyi karịsịa site n’ịgba ndị ihe na-esiri ike ume na inyere ha aka. Ilu 17:17 na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” N’ezie, ndị enyi pụdịrị inwe mmekọrịta chịrị anya karịa ụfọdụ ndị bụ́ ụmụnne. Ilu 18:24 na-ekwu, sị: “Onye na-enwe ọtụtụ enyi na-enwe ha ibibi onwe ya: ma onye na-ahụ n’anya dị [nke] na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu otú ị pụrụ isi mete ezigbo ndị enyi dị otú a? Ọ̀ ga-amasị gị iso n’otu ìgwè e ji ịhụnanya ha nwere n’etiti onwe ha mara? (Jọn 13:35) Ya bụrụ otú ahụ, Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ igosi gị ụzọ ị ga-esi achọta ezigbo ndị enyi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya