Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 12/15 p. 32
  • Krismas Olee Ebe O Cheziri Ihu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Krismas Olee Ebe O Cheziri Ihu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 12/15 p. 32

Krismas Olee Ebe O Cheziri Ihu?

AFỌ iri gara aga, n’ọnwa a, magazin bụ́ U.S.News & World Report bu isiokwu a n’ihu ya “Ọchịchọ A Na-achọ Ezi Krismas.” Isiokwu ahụ lekwasịrị anya n’ịmata ma Krismas ọ̀ “na-akawanye mma, ma à na-akwụsịlata iji ya akpa ego.” À na-akwụsịlatanụ iji ya akpa ego?

Isiokwu ahụ kwuru ihe mere na anyị ekwesịghị ịtụ anya na ọ ga-adị otú ahụ. O kwuru, sị: “Ọ dịghị ihe e dere ede na-egosi na e mere ememe ncheta ọmụmụ Kraịst tupu narị afọ nke anọ, mgbe Constantine . . . bụ eze ukwu Rom.” Nke ahụ gosiri na “ọ dịchaghị onye maara kpọmkwem mgbe a mụrụ Jizọs.” Isiokwu ahụ kwetara na “akwụkwọ ndị na-eso ụzọ Jizọs dere ekwughị ihe ọ bụla banyere afọ a mụrụ ya, ma ya fọkwa ikwu ọnwa ma ọ bụ ụbọchị ọ bụ.” Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme nke na-arụ na Mahadum Texas kwuru na “Ndị Kraịst mbụ enweghị nnọọ mmasị ime ememe ncheta ọmụmụ Jizọs.”

N’okpuru isiokwu nta bụ́ “Akọmakọ,” isiokwu ahụ kwuru “otú chọọchị si malite ime ememe ncheta ọmụmụ Jizọs na December 25.” O kwetara, sị: “Ihe ọtụtụ ndị kweere bụ na ihe mere e ji malite ime ya bụ na mba nile kwekọrịtara ime ka ememe Saturnalia na ememe ndị ọgọ mmụọ ndị ọzọ ‘ghọọ ememe Ndị Kraịst.’” “Site n’itinye Krismas n’ọgwụgwụ December, bụ́ mgbe ndị mmadụ ji eme ememe kemgbe ụwa, ndị isi chọọchị mere ka ememe ncheta ọmụmụ Onye Nzọpụta gbasaa ebe nile.” N’etiti narị afọ nke 19, ihe e lekwasịziri anya n’oge Krismas bụ ịzụ na inye ndị mmadụ onyinye. “Onyinye a malitere inye n’oge Krismas mere ka ahịa gawara ndị ọchụ nta ego, n’oge na-adịghịkwa anya, ndị ahịa na ndị na-akpọsa ngwá ahịa malitere ịkpọsa oge ezumike ahụ.”

N’ihi ya, ọ dịghị ihe mere a ga-eji na-atụ anya na Krismas ga na-akawanye mma. Ọ bụ ezie na ihe e ji mara Krismas nke oge a bụ “oké azụmahịa,” nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị mgbe ezi Ndị Kraịst bu n’obi na ha ga-eme ememe ncheta ọmụmụ Jizọs. Kama nke ahụ, Bible kwusiri okwu ike banyere ihe mgbapụta nke Kraịst nyere site n’ọnwụ ya na mbilite n’ọnwụ ya gaa n’eluigwe. (Matiu 20:28) Ọ bụ ya bụ ihe kasị mkpa, bụrụkwa ihe ga-akasị mkpa mgbe nile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya