Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 5/15 p. 3-4
  • Ị̀ Na-atụ Ọdịnihu Egwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-atụ Ọdịnihu Egwu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zụlite Obi Gị Ịtụ Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Nọrọ N’ụjọ?
    Teta!—2005
  • Ịmụta Otú E Si Achọta Obi Ụtọ n’Egwu Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Tụọ Egwu Jehova, Nyekwa Aha Nsọ Ya Otuto
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 5/15 p. 3-4

Ị̀ Na-atụ Ọdịnihu Egwu?

E NWERE ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji atụ egwu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-atụ egwu otú ụwa ga-adị n’ọdịnihu. Magazin Time nke April 3, 2006 kwuru, sị: “Oké okpomọkụ, idei mmiri, ọkụ ọgbụgba, na ọtụtụ ice ndị na-agbazenụ gosiri na ọnọdụ ihu igwe nke ụwa anyị a aghasaala.”

Na May 2002, Ngalaba Mba Ndị Dị n’Otu nke Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi wepụtara akụkọ nke a kpọrọ “Ọnọdụ Ebe Obibi n’Ọdịnihu-Akụkụ nke Atọ.” A chịkọtara ya site n’aka ihe karịrị otu puku mmadụ. Otu akụkọ ụwa kwuru na akụkọ ahụ kwuru, sị: “Mbara ala anyị nọ n’ọnọdụ chọrọ nlezianya n’ihi na mkpebi ndị e mere taa ga-emetụta ọdịnihu nke oké ọhịa, oké osimiri, osimiri, ugwu, ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ na-akwado ndụ bụ́ ndị ọgbọ dị ugbu a na ndị a ga-enwe n’ọdịnihu dabeere na ha.”

Otú ọnọdụ ụwa dị ugbu a so na-akpatara ụmụ mmadụ nchegbu. Ndị nọ n’akụkụ nile nke ụwa nọzi n’egwu n’ihi ndị na-eyi ọha egwu. Osote onyeisi ndị uwe ojii nzuzo Canada kwuru, sị: “Anyị na-amụ anya n’abalị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ọjọọ anyị na-amaghị ma ọ̀ ga-eme eme.” N’ezie, nanị ikiri akụkọ ụwa a na-akọ na televishọn ná mgbede nwere ike ịkpatara mmadụ nchegbu!

Ọtụtụ ndị toro eto na-arụsi ọrụ ike na-atụ egwu na e nwere ike ịchụ ha n’ọrụ. Ịchụ ndị mmadụ n’ọrụ, imechi ụlọ ọrụ, mmarịta aka n’ebe ọrụ, na ndị a na-arụrụ ọrụ ịchọ ihe gabigara ókè n’aka ndị ọrụ ha nwere ike ime ka ndị mmadụ gharakwa iji ọrụ ha n’aka. Ndị na-eto eto na-atụ egwu na ndị ọgbọ ha ga-ajụ ha. Ụmụaka nwere ike ịdị na-atụ egwu na ndị mụrụ ha ahụchaghị ha n’anya. Ma olee otú ihe ndị na-eme gburugburu ha n’ụwa si emetụta ha? Otu nwanyị nwere ụmụ bụ́ onye na-echegbu onwe ya kwuru, sị: “Ihe ụmụaka na-enwebeghị ihe ha ma na-ahụ ma ha si n’ụlọ pụọ aghaghị ịdị na-atụ ha ụjọ mgbe ụfọdụ.” Ọtụtụ ndị nne na nna na-echegbukwa onwe ha banyere otú ndụ rere ure ndị mmadụ na-ebi n’ụwa a ga-esi emetụta ndị ha hụrụ n’anya, karịsịa ụmụ ha.

Ndị agadi na-atụkarị egwu isi n’elu steepụ daa ma ọ bụ ndị omekome ịwakpo ha n’ụzọ. Ee, “ha ga-atụ egwu ihe dị elu, ihe ụjọ dị iche iche ga-adịkwa n’ụzọ.” (Eklisiastis 12:5) Ndị mmadụ na-atụkwa egwu ọrịa ọjọọ. Akụkọ anyị na-anụ banyere ọrịa ndị na-egbu egbu a na-ebute n’ikuku, cancer, na ọrịa ndị na-efe efe nwere ike ime ka anyị tụwa ụjọ na anyị ma ọ bụ ndị ezinụlọ anyị nwere ike ibute ọrịa ndị ọhụrụ nwere ike ịkwarụ ma ọ bụ gbuo anyị. N’ezie, mgbe anyị hụrụ ka ndị ahụ́ dị, bụ́kwa ndị gbasiri ike dara ọrịa, anyị nwere ike ichewe na ihe dị otú ahụ ga-eme anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya. Ọ na-ewutekwa ewute ileba onye na-arịa ọrịa anya ná mkpụrụ anya ma hụ na o nwekwaghị olileanya!

Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ihe na-eme ka anyị na-atụ egwu, ò nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu? Ọ̀ dị ihe ga-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe olileanya na ihe ga-adị mma? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

© Jeroen Oerlemans/Panos Pictures

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya