Ihe Ndị Dị Mkpa Ndị Na-eto Eto Kwesịrị Ịmụta
GLADYS na-arụ ọrụ n’otu ụlọ akwụkwọ dị na Mendoza, Argentina. Otu ụbọchị, ka ọ na-agafe otu klas, ọ hụrụ ka otu onye nkụzi na-agụrụ ụmụ klas ya nọ n’agbata afọ itoolu na afọ iri Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible.a Gladys gwara onye nkụzi ahụ na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova ma kwe ya nkwa na ya ga-egosi ya otú akwụkwọ ahụ ga-esi baara ya uru karịsịa. Ihe Gladys kọọrọ onye nkụzi ahụ banyere akwụkwọ ahụ masịrị ya nnọọ nke na ọ chọrọ ka akwụkwọ ahụ bụrụ ihe a ga na-agụ mgbe ọ bụla e nwere ihe ọgụgụ na klas. Ma tupu ya enwee ike ime nke a, ọ ga-ebu ụzọ nata ikike n’aka ndị na-elekọta ụlọ akwụkwọ ahụ. O nwere ọṅụ dị ukwuu mgbe e nyere ya ikike ime otú ahụ.
Mgbe o ruru n’ụbọchị e wepụtara maka iji gosi abamuru dị n’ịgụ akwụkwọ ọgụgụ, onye nkụzi ahụ gwara ụmụ akwụkwọ ya ka ha gụpụta otu isiakwụkwọ nke akwụkwọ ahụ n’ihu ụmụ akwụkwọ ibe ha. N’ihi otú ụmụaka ahụ si mee nke ọma n’ihe ọgụgụ ha, a kpọrọ onye nkụzi ahụ ka ọ bịa n’otu ihe omume a na-egosi na televishọn n’obodo ahụ, bụ́ nke a na-agba onye a kpọrọ ajụjụ ọnụ. Mgbe e kwutere banyere àgwà ụmụ akwụkwọ, onye na-agba onye nkụzi ahụ ajụjụ ọnụ na televishọn jụrụ ya, sị, “Olee otú i si eme ka ụmụaka nọ na klas gị na-anọ jụụ?” Onye nkụzi ahụ kwuru na ya na-eji akwụkwọ bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible na-akụziri ha ihe. O kwuru na ọ bụ ezie na ya adịghị akụzi banyere okpukpe na klas ya, akwụkwọ a enyerela ya aka ịkụziri ha ka ha na-akpa àgwà ọma ndị dị ka ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù, ịghara ịdị na-achọ okwu, ịdị n’otu, imekọ ihe ọnụ, irube isi na ịhụ ụmụ akwụkwọ ibe ha n’anya. Mmadụ nile kwetara na ihe ndị a bụ àgwà ndị dị mkpa ka ndị na-eto eto mụta.
Ị̀ ga-achọ ịkụziri ụmụ gị àgwà ọma ndị dị otú a? Ị pụrụ ịgwa otu n’ime Ndịàmà Jehova ka o wetere gị akwụkwọ a na-adọrọ nnọọ mmasị bụ́ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible.
[Ihe e dere n’ala ala peeji nke]
a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.