Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 12/1 p. 32
  • Jizọs Ò Nwere Bible?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ò Nwere Bible?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 12/1 p. 32

Jizọs Ò Nwere Bible?

EE E, Jizọs enweghị Bible. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nweghị Bible zuru ezu n’oge Jizọs dị ka e nwere ya n’oge anyị a. Ma, n’ụlọ nzukọ ndị e nwere mgbe ahụ, e nwere ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta ihe ndị e dere na ha dịzi na Bible e nwere taa. Jizọs gụrụ ihe sitere n’akwụkwọ mpịakọta Aịzaịa mgbe ọ nọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret. (Luk 4:16, 17) Pọl onyeozi nụrụ ‘mgbe a gụrụ Iwu ahụ na akwụkwọ ndị amụma n’ihu ọha’ n’Antiọk dị na Pisidia. (Ọrụ 13:14, 15) Jems onye na-eso ụzọ kwuru na “a na-agụpụta [ihe ndị Mozis dere] n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.”—Ọrụ 15:21.

È nwere ndị nwere akwụkwọ mpịakọta nke Akwụkwọ Nsọ nke ha na narị afọ mbụ ahụ? Ihe ama gosiri na ọnaozi Etiopia ahụ na-eje ozi n’obí Eze Nwanyị bụ́ Kandes nwere nke ya, n’ihi na ọ nọ “n’ụgbọ ịnyịnya ya ma na-agụpụta akwụkwọ Aịzaịa onye amụma” mgbe onye na-eso ụzọ bụ́ Filip zutere ya n’ụzọ e si aga Geza. (Ọrụ 8:26-30) Pọl onyeozi gwara Timoti ka o weta “akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịsịa akpụkpọ anụ ndị ahụ e ji ede ihe.” (2 Timoti 4:13) Ọ bụ eziokwu na Pọl ekwughị kpọmkwem ụdị akwụkwọ mpịakọta ndị ọ sịrị Timoti weta, o nwere ike ịbụ ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị mejupụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru ka ọ sịrị ya weta.

Alan Millard, onye bụ́ prọfesọ n’ihe banyere asụsụ ndị Juu, kwuru na o yiri ka ọ bụ nanị “ndị ọnụ na-eru n’okwu na Palestaịn, ndị na-ekwu na ha gụrụ akwụkwọ, ụfọdụ ndị Farisii, na ndị nkụzi dị ka Nikọdimọs” nwere akwụkwọ mpịakọta nke Akwụkwọ Nsọ, n’etiti ndị Juu. Otu ihe kpatara ya bụ n’ihi na ọ dị ọnụ. Millard kwuru na ‘akwụkwọ mpịakọta Aịzaịa nwere ike ịdị na-ada ihe dị ka site na dinarịọs isii ruo iri’ kwuokwa na Bible Hibru zuru ezu “ga-ewe mpịakọta akwụkwọ iri na ise ruo iri abụọ,” ma ọ bụkwanụ daa ihe dị ka ụgwọ ọnwa ọnwa isii.

Bible agwaghị anyị ma Jizọs ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya hà nwere akwụkwọ mpịakọta nke Bible otu otu. Ma ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na Jizọs maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma nke mere o ji nwee ike izo aka na ha ma ọ bụ gụọ ha n’isi. (Matiu 4:4, 7, 10; 19:4, 5) Nke a ò kwesịghị ịkpali anyị taa ịmara Bible nke ọma, ebe ọ bụ na ha ka nnọọ ọnụ ala ugbu a ma dị mfe nnweta?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya