Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 12/1 p. 3
  • “Ruo Ole Mgbe Ka M Ga Na-eti Mkpu Enyemaka?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ruo Ole Mgbe Ka M Ga Na-eti Mkpu Enyemaka?”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tụkwasị Jehova Obi Ka I Wee Dị Ndụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ogologo Oge Hà Aṅaa Fọdụụrụ Ndị Ajọ Omume?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ịṅụrị Ọṅụ n’Ime Chineke nke Nzọpụta Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 12/1 p. 3

“Ruo Ole Mgbe Ka M Ga Na-eti Mkpu Enyemaka?”

Jayne kwara ákwá, sị: “Ihe m chọrọ nnọọ bụ ka ihe mgbu a kwụsị!” Ọ na-arịa ọrịa kansa, ọrịa ahụ na-agbasakwa n’ahụ́ ya. Ọ dị nnọọ ndị ikwu na ibe ya ka ha wepụ ọrịa ahụ na ihe mgbu ọ na-enwe! Ha kpekuru Chineke ekpere ka o nyere ya aka. Ọ̀ ga-anụ ekpere ha? Ọnọdụ ahụ ò metụrụ ya n’obi?

CHINEKE maara ọnọdụ ụmụ mmadụ nọ n’ime ya. Okwu ya, bụ́ Baịbụl kwuru, sị: “Ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Chineke maara na e nwere ọtụtụ narị nde mmadụ na-enwe ihe mgbu kwa ụbọchị ka Jayne, ma nke anụ ahụ́ ma nke uche. Chineke na-ahụ narị nde mmadụ asatọ na-alaba agụụ kwa abalị, ọtụtụ nde ndị ọzọ a na-emeso ihe ike n’ezinụlọ ha, na ọtụtụ ndị nne na nna na-atụ ụjọ banyere ọdịnihu nke ụmụ ha nakwa ọdịmma ha. Ì chetụla ma Chineke ọ̀ ga-eme ihe banyere ọnọdụ ndị a? N’ezie, ebe ọ bụ na anyị na-achọ inyere ndị anyị hụrụ n’anya aka, Chineke ọ́ gaghị achọ inyere ụmụ mmadụ aka, bụ́ ndị o kere eke?

Ọ bụrụ na ị jụọla ajụjụ ndị ahụ, ọ bụghị naanị gị na-ajụ ha. Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị isii gara aga, ọ dị otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Habakọk, otú ọ dị ọtụtụ ndị taa, ya ajụọkwa Chineke, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka, ma ị dịghị anụ ya? Ruo ole mgbe ka m ga na-akpọku gị ka i nyere m aka napụta m n’ihe ike, ma ị dịghị azọpụta m? Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya? Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m, gịnị mere esemokwu ji na-adị, gịnịkwa mere e ji na-alụ ọgụ?” (Habakọk 1:2, 3) Habakọk, bụ́ onye amụma Hibru, hụrụ ime ihe ike na mmegbu na-enweghị isi na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’oge ya. Taa, a na-anụ ụdị ihe ndị ahụ kwa ụbọchị, ọ na-awụkwa ndị nwere obi ọmịiko akpata oyi n’ahụ́.

Chineke ò leghaara ihe ahụ na-enye Habakọk nsogbu n’obi anya? Mba. O gere ntị n’ajụjụ ndị ahụ Habakọk ji ezi obi jụọ, kasie ya obi ma gbaa nwoke a obi na-erughị ala ume. Jehova Chineke mere ka okwukwe Habakọk sie ike site n’ikwe ya nkwa na Ya ga-akwụsị ahụhụ. Okwu na-enye olileanya Chineke gwara Habakọk nwekwara ike ịgba gị ume, dị ka ọ gbara Jayne na ndị ezinụlọ ya. Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a: Olee otú anyị nwere ike isi jide n’aka na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi n’ezie? Olee ihe Chineke ga-eme iji kwụsị ahụhụ, oleekwa mgbe ọ ga-eme ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya