Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 3/1 p. 23
  • Ọ “Na-ahụ Ihe Dị n’Obi”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ “Na-ahụ Ihe Dị n’Obi”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ahọrọ Devid
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ọ Tachiri Obi n’Agbanyeghị na Ihe Agaghị Otú Ọ Tụrụ Anya Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Nwoke Obi Jehova Nabatara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Samuel Kwalitere Ezi Ofufe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 3/1 p. 23

Bịaruo Chineke Nso

Ọ “Na-ahụ Ihe Dị n’Obi”

1 SAMUEL 16:1-12

ỌDỊDỊ mmadụ nwere ike imegharị anyị anya. Ihe mmadụ bụ n’elu ahụ́ anaghị egosicha ihe ọ bụ n’ime, n’ime ime obi ya. Ụmụ mmadụ na-ejikarị ọdịdị mmadụ ekpebi ụdị onye ọ bụ. Obi dị anyị ụtọ na Jehova Chineke na-ahụ karịa ihe mmadụ bụ n’elu ahụ́. Ihe e kwuru na 1 Samuel 16:1-12 mere ka nke a doo anya.

Chegodị echiche otú ihe ahụ si mee. Jehova na-achọ ite eze ọhụrụ ga-achị mba Izrel mmanụ. Chineke gwara Samuel onye amụma, sị: “M ga-edunye gị ka ị gakwuru Jesi onye Betlehem, n’ihi na esiwo m n’etiti ụmụ ya ndị ikom họtara onwe m eze.” (Amaokwu nke 1) Jehova agwaghị ya aha onye ọ bụ, naanị ihe ọ gwara ya bụ na onye ahụ ya họọrọ bụ otu n’ime ụmụ ndị ikom Jesi. Ka Samuel na-aga Betlehem, o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche, sị, ‘Olee otú m ga-esi mara onye Jehova họọrọ n’etiti ụmụ ndị ikom Jesi?’

Mgbe Samuel rutere Betlehem, o mere ndokwa ka ya na Jesi na ụmụ ya ndị ikom rikọọ nri e ji chụọrọ Jehova àjà. Mgbe Elayab, bụ́ ọkpara Jesi, batara, ọdịdị ya masịrị Samuel ozugbo. Samuel chere na ọdịdị Elayab bụ nnọọ ọdịdị onye eze, ya agwakwa onwe ya, sị: “N’ezie, onye Jehova tere mmanụ guzo n’ihu ya.”—Amaokwu 6.

Ma, ọ bụghị otú ahụ ka Jehova si lee ya anya. Ọ gwara Samuel, sị: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya, n’ihi na ajụwo m ya.” (Amaokwu 7) Otú Elayab si too ogologo ma maa mma abụghị ihe bụ́ mkpa Jehova. Anya Jehova nke na-ahụ ihe niile na-ahụ ihe karịrị ọdịdị elu ahụ́ ma na-aga n’ebe a na-ahụ ezi ịma mma.

Jehova kọwaara Samuel, sị: “N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ, n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (Amaokwu 7) Ee, ọ bụ obi—ihe mmadụ bụ n’ime, bụ́ nke na-ekpebi otú onye ahụ si eche echiche, akpa àgwà, na ihe na-amasị onye ahụ—bụ ihe dị Jehova mkpa. Onye “na-enyocha obi” jụrụ Elayab—jụkwa ụmụ ndị ikom Jesi isii ndị ọzọ bịara n’ihu Samuel.—Ilu 17:3.

Jesi nwere nwa nwoke ọzọ, Devid, bụ́ ọdụ nwa ya, onye “na-azụ atụrụ.” (Amaokwu 11) N’ihi ya, a gara kpọọ Devid n’ebe ọ na-azụ atụrụ, ya abịakwutekwa Samuel. Jehova gwaziri Samuel, sị: “Bilie, tee ya mmanụ, n’ihi na ọ bụ onye a!” (Amaokwu 12) O doro anya na Devid bụ “nwa okorobịa anya ya mara mma, nke makwara mma ile anya.” Ma, ọ bụ otú obi ya dị mere o ji nnọọ bụrụ onye obi Chineke nabatara.—1 Samuel 13:14.

N’ụwa nke ji mma elu ahụ́ kpọrọ ihe gabiga ókè, ọ na-akasi anyị obi ịmara na ọdịdị elu ahụ́ anaghị emegharị Jehova Chineke anya. Ọ chọghị ịma otú i toruru n’ogologo ma ọ bụ ma ndị ọzọ hà na-ele gị anya ka onye mara mma. Ihe dị Jehova mkpa bụ ihe ị bụ n’ime, n’ime obi gị. Ịmata nke ahụ ọ̀ na-akpali gị ịchọ inweta àgwà ndị ga-eme ka ị maa mma n’anya Chineke?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya