Olee Ihe Ọtụtụ Ndị Na-atụ Ụjọ?
“Ọ dịghị gị mkpa ịbụ onye okpukpe tupu i kwere na ọdachi chere ụmụ mmadụ ihu.”—STEPHEN O’LEARY, OSOTE PRỌFESỌ, MAHADUM EBE NDỊDA KALỊFỌNỊA.a
Ì KWEERE ihe ahụ e kwuru n’elu? Isiokwu atọ ndị bu ụzọ na magazin a ga-atụle ihe ụfọdụ mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ ọdịnihu. Ma, ọ ga-egosikwa ihe mere obi nwere ike iji sie gị ike na ihe niile dị ndụ n’ụwa agaghị agwụ. E nwere ezigbo ihe mere anyị kwesịrị iji nwee nchekwube, n’agbanyeghị akụkọ ndị na-emetụ n’ahụ́ ị na-aga ịgụ.
A ka na-atụ ụjọ na agha ọgwụrụ mba nwere ike ịda. N’afọ 2007, magazin bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụ kemgbe a tụchara bọmbụ atọm na Hiroshima na Nagasaki ka ụjọ tụwara ụwa na oké ọdachi dị otú ahụ nwere ike ịdakwasị ya.” Olee ihe mere ndị mmadụ ji atụ ụjọ? Magazin ahụ kọrọ na n’afọ 2007, e nwere ihe dị ka puku ngwá agha ọgwụrụ mba iri abụọ na asaa ka fọrọnụ nakwa na ‘e nwere ike ịgbapụ puku abụọ n’ime ha n’ime nkeji ole na ole.’ Ọ bụrụgodị na ọ bụ ole na ole n’ime ngwá agha ndị ahụ ka a gbapụrụ, ha ga-akpata nnukwu ọdachi!
Ụjọ agha ọgwụrụ mba ò belatala kemgbe ahụ? Akwụkwọ mgbaafọ bụ́ SIPRI Yearbook 2009bc kwuru na ma ‘ọ́ bụghị na mba ise a kacha mara amara nwere ngwá agha ọgwụrụ mba—Chaịna, Frans, Rọshịa, Yunaịted Kịndọm, na Amerịka—adịla njikere ịgbapụ ngwá agha ọgwụrụ mba ndị ọhụrụ, ya abụrụ na ha amaala ọkwa na ha chọrọ ime otú ahụ.’ Ma, akwụkwọ mgbaafọ ahụ na-ekwu na ọ bụghị naanị mba ndị ahụ nwere ngwá agha ọgwụrụ mba. Ndị na-eme nchọpụta na-eche na India, Pakistan, na Izrel nwechara ngwá agha ọgwụrụ mba dị n’agbata iri isii na iri asatọ. Ha kwukwara na gburugburu ụwa, e nwere ngwá agha ọgwụrụ mba dị puku asatọ, narị atọ na iri itoolu na abụọ e nwere ike ịgbapụ mgbe ọ bụla!
Mgbanwe ihu igwe nwere ike ịkpata ọdachi. Magazin bụ́ Bulletin of the Atomic Scientists, nke e kwurula ihe sitere na ya, kọrọ, sị: “Ọdachi mgbanwe ihu igwe nwere ike ịkpata fọrọ obere ka o ruo ka nke ngwá agha ọgwụrụ mba nwere ike ịkpata.” Ndị ọkà mmụta sayensị a na-akwanyere ùgwù, dị ka Stephen Hawking, prọfesọ Mahadum Kembrij nke larala ezumike nká, na Sir Martin Rees, Ọkachamara nke Ụlọ Akwụkwọ Trinity dị na Mahadum Kembrij, na-ekwukwa ihe yiri nke ahụ. Ha na-eche na iji nkà na ụzụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na mmebi ụmụ mmadụ na-emebi ụwa nwere ike ịgbanwe ndụ n’ụwa otú ọ na-agaghị enwe mmekwata ma ọ bụdị bibie mmadụ niile bi n’ụwa.
Amụma ọgwụgwụ ụwa na-atụ ọtụtụ nde mmadụ ụjọ. Ọ bụrụ na i denye okwu ndị bụ́ “ọgwụgwụ ụwa” na afọ bụ́ “2012” n’otu n’ime ebe ndị a ma ama a na-eme nnyocha n’Ịntanet, ị ga-ahụ ọtụtụ akọmakọ a kọrọla banyere otú ụwa ga-esi gwụ n’afọ ahụ. Olee ihe mere o ji dị otú ahụ? E chere na kalenda oge ochie ndị Maya, nke a maara dị ka “Ọgụgụ Oge Toro Ogologo,” ga-agwụ n’afọ 2012. Ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ na nke ahụ pụtara na ụmụ mmadụ ga-agwụ n’ụwa n’afọ ahụ.
Ọtụtụ ndị okpukpe kweere na Baịbụl na-akụzi na a ga-ebibi ụwa nkịtị. Ha chere na a ga-akpọrọ ndị kwere ekwe niile kwesịrị ntụkwasị obi gaa eluigwe, hapụzie ụmụ mmadụ fọrọ afọ ka ha tawa ahụhụ n’ụwa nọ n’ọgba aghara ma ọ bụkwanụ tụba ha n’ọkụ ala mmụọ.
Baịbụl ò kwuru n’ezie na a ga-emebi ma ọ bụ bibie ụwa kpamkpam? Jọn onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Unu ekwerela okwu dum si n’aka mmụọ, kama nwaleenụ okwu si n’aka mmụọ, ka unu wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke.” (1 Jọn 4:1) Kama ikwere nnọọ ihe ndị ọzọ kwuru, ọ́ gaghị aka mma ịgụ Baịbụl ma jiri anya gị hụ ihe o kwuru banyere ọgwụgwụ ụwa? Ihe ọ na-akụzi nwere ike iju gị anya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Site n’isiokwu bụ́ “Ọdachi Emee Ka Ndị Mmadụ Buwekwuo Amụma Ọgwụgwụ Ụwa,” nke gbara n’ebe ndị MSNBC na-edebe ihe n’Ịntanet, n’Ọktoba 19, 2005.
b SIPRI bụ mkpọbiri aha nke Òtù Stọkom Na-eme Nnyocha n’Ụwa Niile Banyere Udo.
c Ọ bụ Shannon N. Kile, onye na-eme nnyocha nọ n’ọkwá ukwu na onyeisi ndị na-ahụ maka ngwá agha ọgwụrụ mba nke Òtù SIPRI Na-achịkwa Ma Na-egbochi Mgbasa Ngwá Agha; Vitaly Fedchenko, onye na-eme nnyocha nke na-arụrụ Òtù SIPRI Na-achịkwa Ma Na-egbochi Mgbasa Ngwá Agha ọrụ; na Hans M. Kristensen, onyeisi ndị na-eweta akụkọ banyere ngwá agha ọgwụrụ mba nke Òtù Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Amerịka, dere akụkọ ahụ gbara n’akwụkwọ SIPRI Yearbook 2009.
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 4]
Anwụrụ ọkụ bọmbụ: Foto U.S. National Archives; foto ajọ ifufe: Foto WHO/League of Red Cross na U.S. National Archives