Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 11/1 p. 5
  • Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Jehova Na-atụ Anya Ya n’Aka Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Lụso Echiche Ndị Na-adịghị Mma Ọgụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ị Bara Uru n’Anya Chineke!
    Teta!—1999
  • “Gịnị Ka Jehova Na-achọ n’Aka Gị?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 11/1 p. 5

Nke 2

Ejila Onwe Gị Atụnyere Ndị Ọzọ

GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZI? “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”—Ndị Galeshia 6:4.

OLEE IHE MERE O JI ESI IKE? Anyị na-ejikarị onwe anyị atụnyere ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ ndị anyị ka nwee ihe, ma mgbe mgbe, ọ na-abụ ndị ka anyị ike, ndị ka anyị nwee ihe, ma ọ bụ ndị ka anyị nwee nkà. Nke ọ bụla ọ bụ, ọ na-arụpụta ihe na-adịghị mma. Anyị na-ekwere ụgha bụ́ na ihe na-egosi otú mmadụ baruru n’uru bụ ihe o nwere na ihe ọ ga-emeli. Anyị nwekwara ike ịmalite inwere ndị ọzọ anyaụfụ ma ọ bụ nwee mmụọ ịmarịta aka.—Ekliziastis 4:4.

OLEE IHE I NWERE IKE IME? Gbalịa ile onwe gị anya otú Chineke si ele gị. Ka otú o si were gị bụrụ otú i si were onwe gị. “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehovaa na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Otú Jehova si amata uru ị bara abụghị iji gị atụnyere onye ọzọ, kama ọ bụ ịmata ihe dị gị n’obi, inyocha echiche na ebumnobi gị. (Ndị Hibru 4:12, 13) Jehova maara ihe ndị ị na-agaghị emeli, ọ na-agbakwa gị ume ka ị ghara ịchọwa ime ihe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ihe i ji amata uru ị bara bụ iji onwe gị atụnyere ndị ọzọ, ma ọ́ bụghị na ị ga-adị mpako, ya abụrụ na o nweghị mgbe ị ga-enwe afọ ojuju. N’ihi ya, jiri obi umeala kweta na ị gaghị abụ ọkacha mma n’ihe niile.—Ilu 11:2.

Olee kpọmkwem ihe i kwesịrị ime iji baa uru n’anya Chineke? Onye amụma ya o nyere ike mmụọ nsọ, bụ́ Maịka, dere, sị: “Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” (Maịka 6:8) Ọ bụrụ na i soro ndụmọdụ ahụ, Chineke ga-elekọta gị. (1 Pita 5:6, 7) Nke a ó kwesịghị ime ka anyị nwee afọ ojuju?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Aha a kpọrọ Chineke na Baịbụl.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ihe Jehova ji ama uru anyị bara bụ ihe dị anyị n’obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya