Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Ò Nwere Agbụrụ Chineke Hụrụ n’Anya Karịa Agbụrụ Ndị Ọzọ?
▪ Mba o nweghị. Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Ihe Chineke kwuru n’okwu a dị mkpa karịa ihe mmadụ nkịtị na-ezughị okè chere. Ọtụtụ ndị kweere na o nwere agbụrụ ka agbụrụ ndị ọzọ mma. Ọ na-abụkarịkwa agbụrụ nke ha ka ha na-eche na ọ ka mma. Echiche a na-adịghị mma yiri nke otu nwoke aha ya bụ Charles Darwin. Nwoke a dere, sị: “Otu ụbọchị, . . . agbụrụ ndị nke mepere anya ga-egbuchapụ agbụrụ ndị nke na-emepeghị anya ma nọchie ha.” Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị emesiela nnọọ ndị agbụrụ ọzọ ike n’ihi na ha chere na ha karịrị ndị ahụ.
Ò nwere ezigbo ihe mere otu agbụrụ ga-eji chee na ha ka agbụrụ ndị ọzọ mma? Dị ka ihe atụ, ò nwere agbụrụ ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtara na ọ ka agbụrụ ndị ọzọ mma? Mba. Otu ọkà mmụta bụ́ Prọfesọ Bryan Sykes kwuru, sị: “O nweghị ihe a hụrụ n’ime ahụ́ mmadụ nke gosiri na mmadụ niile esighị n’otu agbụrụ. . . . Ndị mmadụ na-ajụ m ma è nwere ihe dị iche n’ọbara onye Gris na nke ndị ọzọ ma ọ bụ n’ọbara onye Ịtali na nke ndị ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị. . . . Anyị niile bụ ụmụnne.”
Ihe a ndị ọkà mmụta chọpụtara na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ otu. Baịbụl kwuru na Chineke kere naanị otu nwoke na otu nwaanyị, ọ bụkwa na ha ka mmadụ niile si. (Jenesis 3:20; Ọrụ 17:26) N’anya Chineke, mmadụ niile si n’otu agbụrụ.
O nweghị ihe Jehova ji ụcha akpụkpọ ahụ́ mmadụ ma ọ bụ otú ihu onye ahụ dị kpọrọ. Kama nke ahụ, ihe o ji kpọrọ ihe bụ obi anyị, ya bụ, ụdị mmadụ anyị bụ n’ime. Ọ sịrị: “Mmadụ na-ele anya n’elu ahụ, ma ana m ele anya n’obi.” (1 Samuel 16:7, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Icheta ihe a Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka. Olee otú ọ ga-esi enyere anyị aka?
N’agbanyeghị agbụrụ anyị si, e nwere ọtụtụ n’ime anyị otú anyị dị na-adịghị mma, anyị agaghịkwanụ agbanweli otú anyị dị. Ma, o nwere ihe ka mkpa anyị nwere ike ịgbanwe, ya bụ, ihe anyị na-eche n’obi na àgwà anyị na-akpa. (Ndị Kọlọsi 3:9-11) Ọ bụrụ na anyị agwa onwe anyị eziokwu, anyị ga-ekweta na o nwere mgbe ọ na-adị anyị ka agbụrụ nke anyị ọ̀ ka agbụrụ ndị ọzọ mma, ma ọ bụdị na agbụrụ ndị ọzọ ka nke anyị mma. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike wepụ ụdị echiche a n’obi anyị n’ihi na Chineke achọghị ka anyị na-ele onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ anya otú ahụ.—Abụ Ọma 139:23, 24.
Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị ana-ele onwe anyị na ndị ọzọ anya otú Jehova si ele mmadụ niile. Okwu ya gwara anyị, sị: “Jehova na-ahụzu ụwa dum iji gosi ike ya maka ndị obi ha zuru ezu n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) N’eziokwu, Jehova ga-enyere anyị aka n’agbanyeghị agbụrụ anyị si.