Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
È Kwesịrị Ime Ụmụ Ọhụrụ Baptizim?
▪ Otu nwaanyị aha ya bụ Victoria kwuru, sị: “Ụjọ nọ na-atụ m na nwanne m nwoke, bụ́ John, ga-aga Limbo.” Gịnị mere ụjọ ji na-atụ ya? Ọ sịrị: ‘John nwụrụ mgbe ọ ka dị obere, mgbe a na-emebeghị ya baptizim, otu ụkọchukwu ndị Katọlik kwukwara na ebe ọ bụ na e meghị ya baptizim, ọ ga-aga Limbo.’ Ihe a ụkọchukwu a kwuru nwere ike ime ka ụjọ tụwa mmadụ. Ma, ihe ahụ o kwuru ò si n’Akwụkwọ Nsọ? Baịbụl ò kwuru na ụmụaka ndị nwụrụ mgbe a na-emebeghị ha baptizim ga-aga pọgatrị?
Baịbụl kwuru na e kwesịrị ime Ndị Kraịst baptizim. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mee[nụ] ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Ị̀ hụrụ na ndị a ga-eme baptizim ga-abụ ndị ghọrọla ndị na-eso ụzọ Jizọs? Nke a pụtara na ha ga-abụ ndị mụtarala banyere Jizọs ma kpebie na ha ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya. O doro anya na nwa a mụrụ ọhụrụ agaghị emeli ihe a.
Ma, ọtụtụ ndị ka na-ekwu na Jizọs kwuru ka a na-eme obere ụmụaka baptizim. Otu pastọ chọọchị Lutheran nke aha ya bụ Richard P. Bucher sịrị: “E kwesịrị ime onye ọ bụla baptizim, ma ụmụ ọhụrụ.” O kwukwara, sị: “Ọ bụrụ na e meghị ha baptizim, a gaghị agbaghara ha, ha ga-enweta ntaramahụhụ.” Ma nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụzọ ihe atọ gosiri na ihe a o kwuru adabaghị n’ihe Jizọs kụziri.
Nke mbụ bụ na Jizọs ekwughị na e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ? Chebagodịrị ihe a echiche: Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya iwu Chineke nke ọma. Mgbe ụfọdụ, ọ na-akụziri ha otu ihe ugboro ugboro. Gịnị mere o ji eme otú ahụ? Ọ bụ iji hụ na ndị na-eso ụzọ ya ghọtara ihe ọ na-agwa ha. (Matiu 24:42; 25:13; Mak 9:34-37; 10:35-45) Ma, o nwetụdịghị mgbe ọ kụziri ha na e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim. Ọ̀ ga-abụ na Jizọs chefuru ya? Mbanụ! A sị na e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim, Jizọs gaara ekwu ya.
Nke abụọ bụ na o nwetụdịghị mgbe Jizọs kwuru na mmadụ na-ata ahụhụ ma ọ nwụọ. O kweere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Akwụkwọ Nsọ kwuru hoo haa, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Jizọs maara na ndị nwụrụ anwụ anaghị ata ahụhụ na pọgatrị, Limbo, ọkụ ala mmụọ, ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. Kama nke ahụ, ọ kụziiri ndị mmadụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, na o yiri ka hà nọ n’ụra.—Jọn 11:1-14.
Nke atọ bụ na Jizọs kwuru na a ga-akpọlite “ndị niile nọ n’ili ncheta” ka ha dịkwa ndụ ọzọ. (Jọn 5:28, 29) O doro anya na ọtụtụ nde mmadụ ndị a na-emeghị baptizim ga-eso na ha. A kpọlite ha n’ọnwụ, a ga-akụziri ha iwu Chineke, ha ga-enwekwa ike ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke e mere ka ọ ghọọ paradaịs.a—Abụ Ọma 37:29.
N’eziokwu, Baịbụl anaghị akụzi na e kwesịrị ime ụmụ ọhụrụ baptizim.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere paradaịs ahụ a ga-enwe n’ụwa nakwa banyere mbilite n’ọnwụ, gụọ isi nke 3 na isi nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.