Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
OLEE otú otu nwa agbọghọ nke ọtụtụ nsogbu bịaara mgbe ọ bụ nwata si nwewezie obi ụtọ ná ndụ? Gịnị nyeere otu nwoke aka ịkwụsị inupụrụ ọchịchị mba ya isi ma ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma? Gụọ akụkọ ndị a ka ị mata azịza ha.
‘Ọ nọ na-agụsi m agụụ ike inweta ndị ga-ahụ m n’anya.’—INNA LEZHNINA
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1981
ABỤ M ONYE: RỌSHỊA
NDỤ M BIRI: ỌTỤTỤ NSOGBU BỊAARA M MGBE M BỤ NWATA
NDỤ M BIRI NA MBỤ: Ntị chiri papa m na mama m. Mgbe ha mụkwara m, ntị chiri m. Malite mgbe ahụ ruo mgbe m gbara afọ isii, enweghị m nsogbu ọ bụla n’ụlọ anyị. Ma papa m na mama m bịaziri gbaa alụkwaghịm. Ọ bụ eziokwu na m dị obere mgbe ahụ, ama m ihe ịgba alụkwaghịm pụtara, o wutekwara m nke ukwuu na ha gbara alụkwaghịm. Papa m kpọrọziiri nwanne m nwoke nke tọrọ m gaa biri n’obodo Troisk, mama m akpọrọ mụnwa gaa biri n’obodo Cheliabinsk. Mama m mechara lụgharịa di. Ma nwoke ọ lụrụ bụ onye aṅụrụma, ọ na-etikwa mụ na mama m ihe mgbe niile.
N’afọ 1993, mmiri riri nwanne m nwoke ahụ m hụrụ n’anya. Ọnwụ ya wutere nnọọ ndị ezinụlọ anyị. O mere ka mama m bidozie ịṅụ oké mmanya, ya esorozie nwoke ahụ ọ lụrụ megbuwe m. Amalitere m chọgharịwa ihe m ga-eme ka ihe kara m mma ná ndụ. Ọ nọ na-agụsi m agụụ ike inweta ndị mụ na ha ga-adị ná mma na ndị ga-ahụ m n’anya. N’ihi ya, ebidoro m ịga chọọchị dị iche iche, na-achọ ihe ga-akasi m obi, ma o nweghị nke m hụrụ.
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: Mgbe m dị afọ iri na atọ, otu nwata nwaanyị mụ na ya nọ na klas kọọrọ m akụkọ ụfọdụ dị na Baịbụl. Nwata nwaanyị ahụ bụ Onyeàmà Jehova. Obi tọrọ m ụtọ mgbe ọ kọọrọ m akụkọ Noa na Job bụ́ ndị fere Chineke n’agbanyeghị na ihe siiri ha ike. Obere oge, Ndịàmà Jehova malitere mụwara m Baịbụl, mụ ebidokwa ịga ọmụmụ ihe ha.
Baịbụl ahụ m malitere ịmụ mere ka m mụta ọtụtụ ihe m na-amabughị. Enwere m nnọọ obi ụtọ mgbe m mụtara na Chineke nwere aha. (Abụ Ọma 83:18) Obi tọkwara m ụtọ mgbe m chọpụtara na ihe niile Baịbụl kwuru na ha ga na-eme “n’oge ikpeazụ” na-eme n’eziokwu. (2 Timoti 3:1-5) Aṅụrị juru m obi mgbe m matara na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, nke bụ́ na m ga-ahụ nwanne m nwoke ahụ ọzọ!—Jọn 5:28, 29.
Ma, ọ bụghị mmadụ niile nwere obi ụtọ na m na-amụ Baịbụl. Mama m na nwoke ahụ ọ lụrụ ejighị anya ahụ Ndịàmà Jehova. Ha gbalịrị ime ka m kwụsị ịmụ Baịbụl. Ma, ekpebisiri m ike na agaghị m akwụsị, n’ihi na ihe m na-amụta na Baịbụl na-eme m obi ụtọ.
Ọ dịghịrị m mfe idi nsogbu ndị ezinụlọ anyị na-enye m. Ma, e nwere nsogbu ọzọ bịaara m. Mmiri rikwara nwanne m nwoke nke m tọrọ. Nwanne m nwoke a na-eso m aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Mgbe ihe a mere, Ndịàmà Jehova nyeere m ezigbo aka. Ọ bụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ka m nwetara ihe ahụ m na-achọ kemgbe ụwa m, ya bụ, ndị ga-ahụ m n’anya na ebe obi ga-eru m ala. Ama m na ọ ga-abụrịrị ha bụ ndị na-efe Chineke otú Chineke chọrọ. N’ihi ya, n’afọ 1996, e mere m baptizim, mụ abụrụzie Onyeàmà Jehova.
URU NDỊ M RITERELA: O meela afọ isii m lụrụ di. Aha di m bụ Dmitry. Ọ bụ ezigbo mmadụ. Anyị abụọ na-eje ozi n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị n’obodo Sent Pitasbọg. Mama m na nwoke ahụ ọ lụrụ anaghịzi ele Ndịàmà Jehova anya ọjọọ.
Ana m ekele nnọọ Jehova n’ihi na ife ya emeela ka m nwee obi ụtọ ná ndụ.
“Ọtụtụ ihe nọ na-enye m nsogbu n’obi.”—RAUDEL RODRÍGUEZ RODRÍGUEZ
[Okwu nkọwa dị na peeji nke 20]
A MỤRỤ M N’AFỌ: 1959
ABỤ M ONYE: KUBA
NDỤ M BIRI: M NUPỤỤRỤ ỌCHỊCHỊ MBA ANYỊ ISI
NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Havana, nke dị na Kuba. N’ebe m nọ too n’obodo ahụ, e nwere ọtụtụ ndị ogbenye, ndị mmadụ na-alụkarịkwa ọgụ n’okporo ụzọ. N’oge ahụ m na-etolite, m nwewere mmasị n’egwuregwu ndị dị ka ịgba mgba, ịgba karat, na ịkụ ọkpọ.
Enwere m isi akwụkwọ, n’ihi ya, ndị mụrụ m gwara m ka m banye mahadum. Mgbe m banyere mahadum, abịara m chewe na ndị na-achị mba anyị kwesịrị ịgbanwe aka ha ji na-achị. Nke a mere ka m kpebizie inupụrụ ha isi. Mụ na otu nwa klas m lụsoro otu onye uwe ojii ọgụ. Anyị bu n’obi ịnara ya égbè ya. Ka anyị na ya nọ na-alụ ọgụ, anyị merụrụ ya ezigbo ahụ́ n’isi. E mechara jide anyị abụọ, kpọchie anyị ma kwuo na a ga-agbagbu anyị. Adị m naanị afọ iri abụọ mgbe ahụ, ma a na-aga ịgbagbu m!
Ka m nọ naanị m n’ụlọ mkpọrọ ebe ahụ a kpọchiri m, m nọ na-amụgharị ihe m ga-eme n’ụbọchị a ga-agbagbu m. Achọghị m ime ka à ga-asị na ụjọ na-atụ m. Ma, ọtụtụ ihe nọ na-enye m nsogbu n’obi. M nọ na-ajụ onwe m, sị: ‘Gịnị mere mmegbu na arụrụala ji ju n’ụwa? Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ ọ̀ pụtara na nke ya agaala?’
OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: E mechara kwuo na a gaghịzi agbagbu anyị, kama na anyị ga-anọ afọ iri atọ n’ụlọ mkpọrọ. Ọ bụ n’oge ahụ ka mụ na Ndịàmà Jehova ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ matara. A tụrụ Ndịàmà Jehova ahụ mkpọrọ maka na ha kpebiri ime ihe Baịbụl kwuru. Ma, otú ha si kata obi na-eme ihe Baịbụl kwuru na otú ha si agara onwe ha n’achọghị nsogbu masịrị m nnọọ. N’agbanyeghị na ha emetaghị ihe a ga-eji tụọ ha mkpọrọ, o nweghị onye ha buuru iwe n’obi.
Ndịàmà Jehova ahụ kụziiri m na Chineke buuru ụmụ mmadụ ihe ọma n’obi. Ha gosiri m ebe Baịbụl kwuru na Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs bụ́ ebe ime ihe ike na mmegbu na-agaghị adị. Ha kụzikwaara m na ọ bụ naanị ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa mgbe ahụ, nakwa na ha ga-ezu okè, dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi.—Abụ Ọma 37:29.
Ihe ndị ahụ Ndịàmà Jehova nọ na-akụziri m tọrọ m ụtọ, ma otú m si akpa àgwà na otú ha si akpa àgwà abụtụdịghị otu. Echere m na enweghị m ike ịnọrọ onwe m n’etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụkwanụ hapụ onye mere m ihe ọjọọ n’emegwaraghị ya. Ihe a mere ka m kpebie na m ga-amalite ịgụ Baịbụl n’onwe m. Mgbe m gụchara ya, achọpụtara m na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova na-akpa àgwà ka Ndị Kraịst oge mbụ.
Ihe ndị m mụtara na Baịbụl mere ka m mata na e nwere ihe ụfọdụ m kwesịrị ịgbanwe ná ndụ m. Dị ka ihe atụ, m na-akpọkarị ndị mmadụ iyi, m kwesịrị ịkwụsị ya, kwụsịkwa ịṅụ sịga. Ihe ọzọ bụ na m kwesịrị isepụ aka n’ihe niile gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ dịrịghị m mfe ịkwụsị ihe ndị a m na-emebu. Ma, Jehova nyeere m aka mụ ejiri nwayọọ nwayọọ kwụsịchaa ha.
Otu n’ime ihe kacha siere m ike bụ ịkwụsị iwe iwe ọkụ. M ka na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ka m nwee ike ịna-ejide onwe m ma mmadụ kpasuo m iwe. Amaokwu ụfọdụ dị na Baịbụl enyerela m ezigbo aka. Otu n’ime ha bụ Ilu 16:32. Ebe ahụ sịrị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike, onye na-achịkwa mmụọ ya dịkwa mma karịa onye weghaara obodo.”
N’afọ 1991, e mere m baptizim, mụ abụrụzie Onyeàmà Jehova. E mere m baptizim ahụ n’ime otu nnukwu drọm dị n’ụlọ mkpọrọ ebe m nọ. N’afọ 1992, a hapụrụ mụ na ụfọdụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ ka anyị lawa. A gwara anyị gaa biri na Spen maka na ndị ikwu anyị bi n’ebe ahụ. Mgbe m rutere Spen, m gara ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ nabatara m nke ọma ka à ga-asị na mụ na ha nọ kemgbe, ha nyekwaara m aka chọtara m ihe m ga-emewe.
URU NDỊ M RITERELA: Enwere m obi ụtọ ugbu a. Mụ na nwunye m na ụmụ anyị abụọ na-efekwa Chineke. M na-ejikwa oge buru ibu aga ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, m na-echeta mgbe ahụ a chọrọ ịgbagbu m, ma, obi na-atọ m ụtọ maka ọtụtụ ihe ọma ndị meerela m kemgbe ahụ. Ihe na-eme m obi ụtọ abụghị naanị na m ka nọ ndụ, kama ihe ọma ndị m na-atụ anya ha na-emekwa m obi ụtọ. M na-atụ anya mgbe Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, bụ́ mgbe mmegbu na “ọnwụ na-agaghịkwa adị.”—Mkpughe 21:3, 4.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]
“Enwere m nnọọ obi ụtọ mgbe m mụtara na Chineke nwere aha”
[Foto dị na peeji nke 20]
Obi na-atọ mụ na di m ụtọ iji vidio ndị e mepụtara n’asụsụ ndị ogbi akụziri ndị ntị chiri ihe