Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 5/15 p. 22
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Jehova Dị Ukwuu n’Ịhụnanya nke Na-eguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Guzosie Ike Mgbe Niile
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 5/15 p. 22

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee otú o si bụrụ na ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Chineke nọ “dị oké ọnụ ahịa n’anya ya”?

▪ Devid si n’ike mmụọ nsọ bụọ abụ, sị: “Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ dị oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Ọma 116:15) Ndụ onye ọ bụla na-efe Jehova bara ezigbo uru n’anya ya. Ma, Abụ Ọma nke 116 anaghị ekwu banyere ọnwụ otu onye na-efe Jehova.

Mgbe a na-ekwu okwu olili ozu Onye Kraịst, e kwesịghị ikwu na ihe e dere n’Abụ Ọma 116:15 na-ekwu banyere onye ahụ nwụrụ anwụ, n’agbanyeghị na onye ahụ guzosiri ike n’ebe Jehova nọ ruo n’ọnwụ. Maka gịnị? Maka na ihe ọbụ abụ ahụ kwuru nwere ihe ọzọ ọ pụtara. Ọ pụtara na Chineke agaghị ekwe ka e gbuo ndị niile na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ n’ihi na o ji ndụ ha kpọrọ ihe.—Gụọ Abụ Ọma 72:14; 116:8.

Abụ Ọma 116:15 mere ka obi sie anyị ike na Jehova agaghị ekwe ka e kpochapụ ndị niile na-efe ya n’ụwa. N’eziokwu, akụkọ banyere Ndịàmà Jehova n’oge anyị a egosila na anyị ediela ọnwụnwa na mkpagbu ndị tara akpụ, nke mere ka o doo anya na Chineke agaghị ekwe ka e gbukpọọ ndị na-efe ya.

Jehova bụ onye kacha ike, o nweghịkwa ihe ga-eme ka nzube ya ghara imezu. N’ihi ya, ọ gaghị ekwe ka e kpochapụ anyị niile. Ọ bụrụ na Chineke ekwe ka ụdị ihe ahụ mee, ọ ga-adị ka ndị iro ya hà ka ya ike. Ụdị ihe ahụ agaghị eme eme! Ọ ga-apụtakwa na nzube Jehova, nke bụ́ na ndị na-efe ya ga-ebi n’ụwa, agaghị emezu. Nzube ya ga-emezurịrị. (Aịza. 45:18; 55:10, 11) A ga-akwụsị ijere Jehova ozi dị nsọ n’ụwa ma ọ bụrụ na e nweghịzi ndị nọ n’ụwa na-efe ya n’ụlọ nsọ ihe atụ ya! A gaghị enwe ndị ga-ebi ‘n’ụwa ọhụrụ,’ ya bụ, ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa anyị a mgbe “eluigwe ọhụrụ” ahụ ga na-achị. (Mkpu. 21:1) O nweghịkwa otú Kraịst ga-esi chịa otu puku afọ ma ọ bụrụ na e nweghị ndị ga-ebi n’ụwa ọ ga-achị.—Mkpu. 20:4, 5.

Ọ bụrụ na Chineke ekwe ka ndị iro ya kpochapụ ndị ya niile n’ụwa, a ga-enwe obi abụọ ma ọ̀ bụzikwa Chineke, ọ ga-emebikwa aha ya. Ọ ga-abụkwara Ọkaakaa Eluigwe na Ala mkparị. Jehova agaghịkwa ekwe ka e kpochapụ ndị niile na-efe ya n’ihi na ọ naghị achọ ka a kparịa ya na aha nsọ ya. Chegodị echiche: Ebe ọ bụ na ‘ikpe na-ezighị ezi adịghị n’ebe Chineke nọ,’ ọ gaghị ekwe ka e gbukpọọ ndị ji obi ha dum na-efe ya n’ụwa. (Diut. 32:4; Jen. 18:25) Ihe ọzọ bụ na, ọ bụrụ na Chineke ekwe ka e gbuo ndị niile na-efe ya, ọ ga-apụta na o mezughị ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́: “Jehova agaghị agbahapụ ndị ya n’ihi aha ukwu ya.” (1 Sam. 12:22) N’eziokwu, “Jehova agaghị ahapụ ndị ya, ọ gaghịkwa ahapụ ihe nketa ya.”—Ọma 94:14.

Obi kwesịrị isi anyị ike ma anyị cheta na o nweghị ihe ga-eme ka e kpochapụ ndị Jehova n’ụwa! N’ihi ya, ka anyị jiri obi anyị niile na-efe Chineke ma tụkwasị nkwa o kwere anyị obi, nke bụ́: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma, ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha si n’ebe m nọ.”—Aịza. 54:17.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

Chineke agaghị ekwe ka e kpochapụ ndị ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya