Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 11/1 p. 4-5
  • Ajụjụ nke Mbụ: Gịnị Mere I Ji Kee M?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ nke Mbụ: Gịnị Mere I Ji Kee M?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịgbalị Ibi Ndụ Nwere Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Oleedị ihe Chineke bu n’obi kee anyị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 11/1 p. 4-5

Ajụjụ nke Mbụ: Gịnị Mere I Ji Kee M?

E NWERE otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rosalind. Ọ bụ onye Ingland. Ọ na-agụ ya agụụ mgbe niile ịmata ọtụtụ ihe ọ na-amaghị. Ọ chọkwara inyere ndị mmadụ aka. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ, o nwetara ezigbo ọrụ. Ihe ọ na-arụ bụ inyere ndị na-enweghị ụlọ aka. O nyekwaara ndị nwere nkwarụ, na ndị ụbụrụ ha na-anaghị aghọcha nkọ aka. Ọ bụ eziokwu na ọrụ a ọ na-arụ dị ya mma, na-enyekwa ya ezigbo ego, o kwuru, sị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, m na-eche, sị, ‘Gịnị mere anyị ji nọrọ ndụ n’ụwa a?’ ‘Gịnị bụ isi ndụ a m dị?’”

Gịnị mere ndị mmadụ ji ajụ ajụjụ a? Ụmụ mmadụ dị iche n’ụmụ anụmanụ. Ha na-eche echiche, ma ụmụ anụmanụ anaghị eche. Anyị na-esi n’ihe ndị mere anyị amụta ihe, anyị na-ahazikwa ihe ndị anyị ga-eme n’ọdịnihu. Anyị na-agbalịkwa ka anyị mata ihe mere anyị ji dịrị ndụ.

Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ekwu? Ọtụtụ ndị na-eche na isi ihe mere anyị ji dịrị ndụ bụ ka anyị baa ọgaranya ma ọ bụ bụrụ ndị a ma ama, ma si otú ahụ nwee obi ụtọ.

Gịnị ka ihe ahụ ha na-ekwu pụtara? Ihe ahụ ha na-ekwu pụtara na ọ bụ anyị ga na-atụrụ onwe anyị ihe ndị anyị ga-eji ndụ anyị na-eme. Ọ pụtakwara na ime ihe dị anyị mma dị anyị mkpa karịa ime uche Chineke.

Gịnị ka Baịbụl na-akụzi? Eze Sọlọmọn bara ezigbo ọgaranya, o mekwara ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka o nwee obi ụtọ ná ndụ. Ma, ọ chọpụtara na ihe ndị ahụ emeghị ka ndụ ya nwee isi. O mechara kwuo ihe ndị ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ sịrị: “Ebe a nụworo ihe a dum, ihe bụ́ nkwubi okwu bụ: Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.” (Ekliziastis 12:13) Olee iwu ụfọdụ Chineke chọrọ ka anyị na-edebe?

Chineke chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. O so n’ihe mere o ji kee anyị. Sọlọmọn dere, sị: “Ọ dịghị ihe dịịrị mmadụ mma karịa iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, meekwa ka mkpụrụ obi ya hụ ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya. Mụ onwe m ahụwo nke a, na o si n’aka ezi Chineke.”—Ekliziastis 2:24.

Chineke chọkwara ka anyị hụ ndị ezinụlọ anyị n’anya ma na-egboro ha mkpa ha. Legọdị ndụmọdụ bara uru o nyere di, nwunye, na ụmụ.

“Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.”—Ndị Efesọs 5:28.

“Nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.”—Ndị Efesọs 5:33.

“Ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi.”—Ndị Efesọs 6:1.

Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a Baịbụl kwuru, anyị ga na-enwe obi ụtọ, ndụ anyị ga-enwekwa isi. Ma, ihe kacha mkpa anyị kwesịrị iji ndụ anyị mee bụ ịmụta ihe niile anyị nwere ike ịmụta banyere Onye kere anyị ma gbalịa ka anyị na ya bụrụ Enyi. Baịbụl gwadịrị anyị ka anyị ‘bịaruo Chineke nso.’ O kwukwara na ọ bụrụ na anyị abịaruo Chineke nso, ọ ’ga-abịarukwa anyị nso.’ (Jems 4:8) Ọ bụrụ na i mee ihe a Baịbụl kwuru, ndụ gị ga-enwe isi.

Rosalind, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a, ahụla na ndụ ya enweela isi ugbu a. Gụọ peeji nke 10 n’Ụlọ Nche a ka ị hụ ihe o kwuru mere ndụ ya ji nwee isi.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú ị ga-esi na-ebi ndụ, ya emee Chineke obi ụtọ, gụọ isi nke 12 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? I nwere ike ịdanlodu ya n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 5]

Gịnị Ka Jizọs Kwuru Banyere Ihe Mere Anyị Ji Dịrị Ndụ?

Jizọs ma ihe mere anyị ji dịrị ndụ. O kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji oge ya niile kụziere ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke na ihe bụ́ uche Chineke.

Ọ bụrụ na anyị emee ka Jizọs, ndụ anyị ga-enwe isi. Jizọs gwadịrị anyị ka anyị mụta ihe n’aka ya. (Matiu 11:29) E nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs. Ka anyị lebagodị anya n’abụọ n’ime ha.

Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ‘ịma mkpa ime mmụọ anyị.’ (Matiu 5:3) Otú anyị ga-esi egosi na anyị ma mkpa ime mmụọ anyị, ya bụ, na anyị chọrọ ka anyị na Chineke dịrị ná mma, bụ ịgbalị ka anyị mụta banyere ‘onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.’—Jọn 17:3.

Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-akụziri ndị ọzọ ihe ndị ha mụtara na Baịbụl. Ọ gwara ha, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

Ndị niile na-amụ Baịbụl ma na-eme ihe ha na-amụta na-achọpụta na ndụ ha akala mma. Ọ na-edo ha anya na ndụ ha enweela isi mgbe ha malitere inyere ndị ọzọ aka ka ha mụta banyere Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya