Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 5/1 p. 7
  • Ị̀ Ga-atụkwasị Chineke Obi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-atụkwasị Chineke Obi?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Ji Ekwu na Obi Tara Chineke Mmiri?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Chineke Na-Akpọ Gị Òkù Ịghọ Enyi Ya
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • M̀ kwesịrị ikwu ihe ọjọọ enyi m mere?
    Teta!—2009
  • Ònye Bụ Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 5/1 p. 7

Ị̀ Ga-atụkwasị Chineke Obi?

WEREGODỊ ya na i nwere otu ezigbo enyi ị tụkwasịrị obi. Otu ụbọchị, ya emee otu ihe juru gị anya, ị ghọtakwanụghị ihe mere o ji mee ihe ahụ, ndị mmadụ ebidokwa na-ekwu okwu ọjọọ gbasara enyi gị ahụ, na-ekwu na obi tara ya mmiri. Ị̀ ga-ekweta ozugbo na enyi gị ahụ bụ onye ọjọọ n’ebughị ụzọ jụọ ya ihe mere o ji mee ihe ahụ? Ọ bụrụkwanụ na ọ nọghị nso ka ọ gwa gị ya, ị̀ ga-agbachi nkịtị ma ghara ikwu na ọ bụ onye ọjọọ?

Tupu gị ana-ekwu ihe ọ bụla, ị ga-ebugodị ụzọ chọpụta ihe ụfọdụ dị mkpa. I nwere ike ịjụ onwe gị, sị, ‘Gịnị na gịnị ka m ma banyere enyi m ahụ? Oleekwa ihe mere m ji tụkwasị ya obi?’ Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, i metara ya. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghịkwa ime otu ihe ahụ tupu anyị ekwuo na obi tara Chineke mmiri?

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ihe ụfọdụ Chineke mere bụ́ ndị ị na-agaghị aghọta ihe mere o ji mee ha. O nwekwara ike iju gị anya na ọ hapụrụ ihe ụfọdụ ka ha na-eme. E nwere ọtụtụ ndị ga-agwa gị na obi kpọrọ Chineke nkụ, ha ga-achọkwa ka i soro ha na-ekwu na Chineke bụ onye ọjọọ. Ị̀ ga-ebu ụzọ chere ka ị mata onye Chineke bụ nke ọma tupu gị ekwuo na ọ bụ onye ọjọọ? Ọ bụ otú ị maruru Chineke ga-ekpebi ihe ị ga-eme. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ọma ndị Chineke meerela m?’

Ọ bụrụ na i nweela ọtụtụ nsogbu ná ndụ, o nwere ike ịdị gị ka ọ̀ bụ na o nwetụbeghị ihe ọma Chineke meere gị. Ma, chegodị echiche. Ọ̀ bụ Chineke kpataara gị nsogbu ndị ahụ ka ọ̀ bụ ya na-emere gị ihe ọma ndị na-eru gị aka? Dị ka anyị kwuru na mbụ, ọ bụ Setan “na-achị ụwa a,” ọ bụghị Jehova. (Jọn 12:31) N’ihi ya, ọ bụ Setan na-akpata ọtụtụ nsogbu na mmegbu ndị anyị na-ahụ n’ụwa. Ọ́ bụghịkwa eziokwu na ọtụtụ nsogbu anyị na-enwe n’ụwa bụ maka na anyị ezughị okè, ọzọ abụrụ na ihe ọjọọ ndị anyị na-atụghị anya ha na-adabara anyị?

Ọ̀ bụ Chineke kpatara nsogbu ndị ị na-enwe ka ọ̀ bụ ya na-emere gị ihe ọma ndị na-eru gị aka?

Ma oleekwanụ ihe ọma Chineke na-emere anyị? Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke “kere eluigwe na ụwa,” gwakwa anyị na o kere anyị “n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.” Baịbụl kwukwara na Jehova bụ “Chineke onye ume ndụ gị dị n’aka.” (Abụ Ọma 124:8; 139:14; Daniel 5:23) Gịnị ka ihe niile a Baịbụl kwuru pụtara?

Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ Chineke mere anyị ji dịrị ndụ. (Ọrụ Ndịozi 17:28) Ọ bụkwa ya nyere anyị ụwa a mara mma, mee ka inwe ezigbo ndị enyi na-atọ anyị ụtọ nakwa ka ndị ọzọ na-ahụ anyị n’anya. Ọ bụkwa ya mere ka ihe oriri na-atọ anyị ụtọ, ka anyị na-anụ ụda egwú na ụda ndị ọzọ, meekwa ka anyị na-anụ ụdị ìsì dị iche iche. (Jems 1:17) Ihe a niile Chineke meere anyị ọ̀ bụ na ha anaghị egosi na ọ bụ ezigbo enyi nke anyị kwesịrị ịkwanyere ùgwù ma tụkwasị obi?

N’eziokwu, o nwere ike isiri gị ike ịtụkwasị Chineke obi. O nwekwara ike ịbụ na ị matabeghị Chineke nke ọma, ma ya fọdụzie ịtụkwasị ya obi. Ọ bụghị ihe ijuanya ma ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ. Ụlọ Nche a agaghị ezuru anyị ilebacha anya n’ihe niile mere ụfọdụ ndị ji eche na obi tara Chineke mmiri. Ma, ọ ga-abara gị ezigbo uru ma ị gbalịa matakwuo onye Chineke bụ.a Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-amata ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke. Ajụjụ bụzi: Obi ọ̀ tara Chineke mmiri? Azịza ya bụ mba n’ihi na “Chineke bụ ịhụnanya.”—1 Jọn 4:8.

a Ị chọọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ dịrị, gụọ isi nke 11 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya