ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLE NDỊ BỤ NDỊÀMÀ JEHOVA?
Gịnị Ka Ndịàmà Jehova Kweere?
Ndịàmà Jehova kweere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke” nakwa na “ọ bara uru.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụ na Baịbụl ka anyị na-amụta gbasara Onye kere anyị na otú anyị ga-esi na-ebi ndụ bara uru.
Baịbụl kwuru, sị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” (Abụ Ọma 83:18) Ọ bụ ya mere anyị ji efe naanị Jehova Chineke ma na-agba mbọ eme ka ndị ọzọ mara aha ya n’ihi na anyị bụ Ndịàmà ya.—Aịzaya 43:10-12.
Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kweere na Jizọs, bụ́ “Ọkpara Chineke,”a bịara n’ụwa, mechaakwa bụrụ Mesaya. (Jọn 1:34, 41; 4:25, 26) Mgbe ọ nwụrụ, a kpọlitere ya, ya alaghachi n’eluigwe. (1 Ndị Kọrịnt 15:3, 4) O mechakwara bụrụ Eze nke Alaeze Chineke. (Mkpughe 11:15) Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-eme ka ụwa a ghọọ Paradaịs. (Daniel 2:44) Baịbụl kwuru na “ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11, 29.
“Ha gụwa Baịbụl, ha na-ewere na Chineke na-agwa ha okwu. Ha nwee nsogbu, ha na-agụ Okwu Chineke iji mata ihe ha ga-eme ka nsogbu ahụ bie. . . . Ha kweere na Okwu Chineke ka dị ndụ.”—Ọ bụ ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Benjamin Cherayath kwuru ihe a. E bipụtara ya n’akwụkwọ akụkọ ndị Jamanị a na-akpọ Münsterländische Volkszeitung
Ndịàmà Jehova kweere na ihe Baịbụl kwuru ga-abara mmadụ uru taa ma ọ na-eme ya. (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụ ya mere anyị ji agbasi mbọ ike eme ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aṅụ sịga, anwụrụ ike ma ọ bụ ọgwụ ike n’ihi na Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara imerụ uche anyị na ahụ́ anyị. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Anyị anaghịkwa aṅụ oké mmanya, akwa iko ma ọ bụ ezu ohi n’ihi na Baịbụl kwuru na àgwà ndị dị otú ahụ adịghị mma.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.
a Baịbụl kwukwara na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya” n’ihi na ọ bụ onye mbụ Jehova kere, ọ bụkwa naanị ya ka Jehova ji aka ya kee.—Jọn 3:18; Ndị Kọlọsi 1:13-15.