Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp16 nke 4 p. 8
  • Ihe Mere Baịbụl Ji Dịgide

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Baịbụl Ji Dịgide
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Baịbụl Bụ Okwu Chineke Gwara Anyị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Akụkọ Dị́ Ezigbo Mkpa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ihe Ga-enyekwuru Ezinụlọ Aka
    Teta!—2018
  • Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?
    Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
wp16 nke 4 p. 8
Ebe otu nwoke na-agụ Baịbụl

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE OTÚ BAỊBỤL SI DỊGIDE?

Ihe Mere Baịbụl Ji Dịgide

Mbọ niile a gbara ka Baịbụl ghara ịdịgide kụrụ afọ n’ala. Ọ bụ ya mere Baịbụl nwere ike iji ruo gị aka taa. Ọ bụrụ na i nweta nke a sụgharịrị nke ọma, obi kwesịrị isi gị ike na ihe ị na-agụ bụ kpọmkwem ihe dị na Baịbụl mbụ e dere.a Ma, gịnị mere Baịbụl ji dịgide n’agbanyeghị na o nwere ike irekasị, na e nwere ndị chọrọ ibibi ya, nweekwa ndị chọrọ ịgbanwe ihe e dere na ya? Olee ihe mere Baịbụl ji dị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ?

“O doola m anya ugbu a na Baịbụl bụ onyinye Chineke nyere anyị”

Pọl onyeozi dere na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Ọtụtụ ndị na-amụ Baịbụl achọpụtala na ihe a Pọl dere bụ eziokwu. Ha kweere na ihe mere Baịbụl ji dịgide bụ n’ihi na ọ bụ Okwu Chineke, nakwa na Chineke hụkwara na ọ dịgidere ruo taa. Faizal, bụ́ nwoke anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu mbụ n’Ụlọ Nche a, mechara kpebie ịmụ Baịbụl ka o jiri aka ya chọpụta ma ihe a gwara ya gbasara Baịbụl ọ̀ bụ eziokwu. Ihe ọ chọpụtara juru ya anya. Ọ chọpụtara na ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị ndị Krisendọm esighị na Baịbụl. Ihe ọ gụtara na Baịbụl gbasara ihe mere Chineke ji kee ụwa metụrụ ya n’ahụ́.

O kwuru, sị: “O doola m anya ugbu a na Baịbụl bụ onyinye Chineke nyere anyị. A sịdị kwuwe, ebe Chineke kere eluigwe na ụwa, ọ̀ bụzi inye anyị akwụkwọ, hụkwa na ọ dịgidere, ka ọ na-agaghị emeli? M kwuo na ọ gaghị emeli ya, ihe m na-ekwu bụ na Chineke abụghị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ònyekwanụ ka m bụ ikwu ụdị ihe a?”—Aịzaya 40:8.

a Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche May 1, 2008.

Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu?

Isiokwu ndị mbụ dị́ n’Ụlọ Nche a ekwuola gbasara otú Baịbụl si dịgide. Ma, olee otú ị ga-esi jide n’aka na Baịbụl bụ “okwu Chineke” n’eziokwu, ọ bụghị akwụkwọ akụkọ ifo? (1 Ndị Tesalonaịka 2:13) Biko, lee vidio aha ya bụ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? na www.jw.org/ig. (Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE pịa ebe e dere VIDIO)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya