Ndị Mmụọ Ozi Hà Dị Adị n’Eziokwu?
Nke 5 2017
© 2017 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
A naghị ere akwụkwọ a ere. O so n’ihe e ji arụ ọrụ ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ụwa dum. E jikwa onyinye si ndị mmadụ n’obi akwado ọrụ a.
Ị chọọ inye onyinye, biko gaa na www.jw.org/ig.
Ọ gwụkwala ma è dere aha Baịbụl ọzọ, amaokwu Baịbụl ndị e dere n’akwụkwọ a si na Baịbụl e ji asụsụ Igbo a na-ede n’oge a dee, ya bụ, Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ.
MAGAZIN A bụ́ Ụlọ Nche na-enye Jehova Chineke, bụ́ Onye na-achị eluigwe na ụwa, otuto. Ozi ọma dị na ya na-akasi ndị mmadụ obi. Ozi ọma ahụ bụ na Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị dị n’eluigwe, ga-eme ka ajọ omume niile kwụsị n’oge na-adịghị anya, meekwa ka ụwa ghọọ paradaịs. Ọ na-agwa ndị mmadụ ka ha nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, bụ́ onye nwụrụ ka anyị wee nweta ndụ ebighị ebi, onye bụ́kwa Eze na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke. Ndịàmà Jehova na-ebipụta magazin a kemgbe afọ 1879. Ọ naghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ihe niile ọ na-ekwu si na Baịbụl.