Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 27, 2017 RUO MACH 5, 2017
7 “Tụkwasị Jehova Obi, Na-emekwa Ihe Ọma”
Isiokwu a kwuru otú isiokwu afọ 2017 si agba anyị ume ka anyị tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka mgbe nsogbu bịaara anyị. Akụkọ gbasara ndị ji obi ha dum fee Jehova n’oge ochie ga-akụziri anyị otú anyị ga-esi atụkwasị Jehova obi na ọ ga-enyere anyị aka, anyị ana-emekwa ihe anyị nwere ike ime iji dozie nsogbu anyị, na-enyekwara ndị ọzọ aka.
IZU NA-AMALITE NA MACH 6 RUO 12, 2017
12 Jiri Ikike Chineke Nyere Gị Ịna-ekpebi Ihe Ị Ga-eme Kpọrọ Ihe
N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi ejiri kike Chineke nyere anyị ikpebi ihe anyị ga-eme eme ihe dị ya mma. Anyị ga-ahụkwa otú anyị ga-esi gosi na anyị ghọtara na ọ bụ ndị ọzọ ka ọ dịịrị ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme.
IZU NA-AMALITE NA MACH 13 RUO 19, 2017
17 Ihe Mere Anyị Ka Ji Kwesị Ịna-adị Umeala n’Obi
IZU NA-AMALITE NA MACH 20 RUO 26, 2017
22 Ị Ga-adịli Umeala n’Obi ma Mgbe O Siri Ike Ime Otú Ahụ
Isiokwu abụọ a ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe ọmarịcha àgwà ahụ bụ́ ịdị umeala n’obi pụtara. Isiokwu nke mbụ ga-akọwara anyị ihe e ji ama onye dị umeala n’obi na ihe e ji ama onye na-adịghị umeala n’obi. Isiokwu nke abụọ ga-akụziri anyị otú anyị ga-esi nọgide na-adị umeala n’obi ma mgbe e nwere ihe mere ka o sie ike ime otú ahụ.
IZU NA-AMALITE NA MACH 27, 2017 RUO EPREL 2, 2017
27 “Nyefee Ya n’Aka Ndị Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
Ka otu ọgbọ na-anọchi ọgbọ ọzọ, ndị na-eto eto na-ewere ọrụ ndị merela agadi na-arụbu. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịghọta otú ndị merela agadi ga-esi enyere ndị na-eto eto aka nakwa otú ndị na-eto eto ga-esi amụta ihe n’aka ha.
32 Ị̀ Maara?