Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
IZU NA-AMALITE NA MEE 29, 2017 RUO JUN 4, 2017
3 “Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”
Nkwa ole ka i kwerela Jehova? Ọ̀ bụ otu, abụọ, ka ọ̀ karịrị? Ì chere na ị na-agbalịsi ike imezu ha? Nkwa i kwekwaranụ mgbe i nyefere Chineke onwe gị ma ọ bụ mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye? Isiokwu a ga-echetara anyị otú Jefta na Hana si mezuo nkwa ha kwere. Ọ ga-abara anyị uru ka anyị ji obi anyị niile na-agba mbọ imezu nkwa anyị kwere Chineke.
IZU NA-AMALITE NA JUN 5 RUO 11, 2017
9 Olee Ihe Na-agaghịzi Adị Mgbe Alaeze Chineke Ga-abịa?
Anyị na-echekarị gbasara ihe Jehova ga-emere anyị ma Paradaịs bịa. Ma n’isiokwu a, anyị ga-elekwasị anya n’ihe ndị ọ ga-ewepụ. Gịnị ka Jehova ga-ewepụ iji mee ka e nwee ụwa ebe udo na obi ụtọ ga-adị? Ichebara azịza ajụjụ a echiche ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, anyị ekpebisikwuo ike ịna-atachi obi.
14 Akụkọ Ndụ—M Kpebisiri Ike Ịbụ Onye Agha Kraịst
IZU NA-AMALITE NA JUN 12 RUO 18, 2017
18 ‘Onyeikpe Ụwa Dum’ Na-eme Ihe Ziri Ezi Mgbe Niile
IZU NA-AMALITE NA JUN 19 RUO 25, 2017
23 Ị̀ Na-ele Ikpe Ziri Ezi Anya Otú Jehova Si Ele Ya?
Anyị chee na e megburu anyị ma ọ bụ onye ọzọ, ihe anyị mere nwere ike ime ka a mata ma ànyị nwere okwukwe, dị umeala n’obi ma na-erubere Jehova isi. Isiokwu abụọ a ga-eme ka anyị ghọta akụkọ atọ a kọrọ na Baịbụl, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịna-ele ikpe ziri ezi anya otú Jehova si ele ya.
IZU NA-AMALITE NA JUN 26, 2017 RUO JULAỊ 2, 2017
28 Na-ewepụta Onwe Gị Ijere Jehova Ozi Ka E Too Ya
Jehova nwezuru ihe niile; ma obi na-adị ya ụtọ ịhụ ka anyị na-agbalịsi ike ịkwado ọchịchị ya. Ndị Ikpe isi anọ na nke ise na-egosi na obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi ma na-eme ihe o kwuru.