Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w17 Ọktoba p. 32
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ka Ee Unu Kwuru Bụrụ Ee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Olee Oké Ihe Ọjọọ Dị n’Ịkpọ Iyi?
    Teta!—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
w17 Ọktoba p. 32

Ị̀ Maara?

Olee ihe ndị Juu na-eme nke mere Jizọs ji kwuo na ịṅụ iyi adịghị mma?

Ebe otu nwoke na-aṅụ iyi n’ụlọ nsọ

IWU Mozis kwuru na e nwere mgbe ndị Juu kwesịrị ịṅụ iyi. Ma n’oge Jizọs, ndị Juu na-aṅụkarị iyi nke na ha na-aṅụ iyi n’ọtụtụ ihe ha na-ekwu. Ha na-eme ya ka ndị mmadụ kweta n’ihe ha na-ekwu. Ma, Jizọs kwuru ugboro abụọ na ihe a ha na-eme adịghị mma. O kwuru, sị: “ka Ee unu kwuru bụrụ Ee, ka Ee e unu kwuru bụrụ Ee e.”​—⁠Mat. 5:​33-37; 23:​16-22.

Akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament kwuru na ihe e dere n’akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ́ Talmud gosiri na ndị Juu na-aṅụkarị iyi iji gosi na ihe ha kwuru bụ eziokwu. Akwụkwọ okpukpe ndị Juu a kọwakwuru ụdị iyi mmadụ kwesịrị imezu na nke ọ na-agaghị emezu.

Ọ bụghị naanị Jizọs kwuru na ihe a ndị Juu na-eme adịghị mma. Dị ka ihe atụ, otu onye Juu na-ede akụkọ ihe mere n’oge ochie aha ya bụ Fleviọs Josifọs kwuru na e nwere otu òtù ndị Juu na-anaghị aṅụ iyi. Ndị òtù a kwuru na ịṅụ iyi ka ịgha ụgha njọ. Ha chere na onye na-aṅụ iyi ka ndị ọzọ kweta n’ihe ọ na-ekwu bụ onye ụgha. Akwụkwọ apọkrịfa ndị Juu a na-akpọ Wisdom of Sirach, ma ọ bụ Ecclesiasticus, (23:11) kwukwara otu ihe ahụ. O kwuru, sị: “Onye na-aṅụkarị iyi abụghị ezigbo mmadụ.” Jizọs kwuziri na ịṅụ iyi n’ihe ndị na-adịghị mkpa, adịghị mma. Ọ bụrụ na anyị ana-ekwu eziokwu mgbe niile, anyị ekwesịghị ịṅụ iyi iji mee ka ndị mmadụ kweta na ihe anyị na-ekwu bụ eziokwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya